Nwa Regina Mba egburu n'Enugwu ekwuola na obara nne ya ga-abọrịrị ọbọ

Ndị Obodo Nchatancha Nike n'Enugwu steeti ka na akwarịrị akwa arịrị maka nwa nne ha nwaanyị bụ Regina Mba egburu n'ugbo ya.
Ọ bụ akpụ ka ọ gara ịbuta n'ugbo ya mgbe nke a mere n'abalị abụọ gara aga.
Nwa ya nwaanyị bụ Amuche Anike ji nnukwu anya mmiri wee kwuo na ọbara nne ya agaghị ezuriri ike ganye na ndị niile gburu ya abanye n'ala dịka ya onwe ya.
Amuche onye nọ na azachasị ụlọ nne ya nwụrụ anwụ kọwara na abalị abụọ gara aga ka ndị agbata obi kpọrọ ya na-ekwe ntị n'abali na nne ya gara ugbo ka mgbe ụtụtụ alọtabeghị.

Nke a mere ojiri si be dị ya bịa na be nna ya soro ndị obodo banye ime ọhịa chọbazịa mama ya.
Amuche kwuru na ọbụzị na ụtụtụ tọzde ka a hụzịrị ọzụ nwaanyị ajadụ ahụ ebe agbara ya atọ, were mma berisia ya dịka e sị ebe anụ.
Ya bụ iheịgba anya mmiri kpatazịrị ụmụ ikorobịa ndị Nchatancha nakwa agbataobi ha niile jiri mee ngaghariwe ụbọchi ahụ were gbachie okporo ụzọ awara awara sị Enugwu gaa Abakaliki.

N'ahịa Nchatancha Nike a na-akpọ ọnụ ọgba, ebe niile nọ na iru ujun'ihi na ha amatebeghị ndị kpara ya bụ arụ n'ọhịa be ha.
Nwanne nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ, otu nne otu nna ya bụ Pastọ Nick Ugwu ji anya mmiri kwuo na ọ bụ Chukwu ga abọrọ ha ọbọ na-aka ndị gburu nwanne ya nwaanyị na-eleghị anya na-azụ.
Ndị Uweojii Enugwu ewepụtalarịị ozi site n'ọnụ onye nkwuchitere ha bụ DSP Ebere Amaraizu sị na ọ bụ eziokwu na ebutere ozu nwaanyị ajadụ ahụ n'ugbo ya na nchatancha Nike,
Ha kwukwara na ndị uweojii na atinyezị anya na mmiri ugbua ịchọpụta ma jide ndị merụrụ ala ahụ.








