Miyetti Allah: 'Anyị ga-agbachi ụlọahịa anyị niile n'Enugwu steeti'

Ngalaba na-ahụ maka ọzụzụ nama bụ Miyetti Allah ekwuola na ha ga-agbachi ụlọahịa niile n'Enugwu n'ụbọchị iri na anọ nakwa iri na ise nke ọnwa Ọgọst.
Ha kwuru na nke a bụ iji kuziere ndị Fulani bi n'Enugwu steeti maka okwu nchekwa.
N'ime akwụkwọ ozi ha ziputere ha kwuru na nkuzi a dị mkpa maka ọnwụ Fr Paul Offu nakwa ndị ọzọ.
Ha kwere nkwa ịnyere gọọmentị Enugwu steeti enyemaka n'ịhazi okwu nchekwa ndụ na akụnaụba steeti ahụ.
Ọzọ na Naịjirịa

BBC ghọtara na otu ụgbọelu Medview na-aga Legọs efeghachila Abuja maka nsogbu ijnin o nwere n'ụzọ.
Ka a na-ekwu nke a, ndị njem ka tọrọ n'ime ya bụ ụgbọelu dịka ndị ọrụ ọdọụgbọelu ekweghi ha bata n'ime ọdọụgbọelu ahụ.
Ụfọdụ ndị a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha kwesiri iji Dana Air mee ya bụ njem mana emechara tinye ha n'ụgbọelu ndị Medview.
Dịka ha si kwuo, o nweghi onye ọrụ Medview kọwara ha ihe na-eme maọbụ ihe na-aga aga
N'akụkọ mba ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Jeffrey Epstein bụ onye ọrụ ego anwụọla n'ime ụlọ mkpọrọ dịka ọ na-eche ka akpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo ịgba mgbere mmadụ.
Cheta na achọtara ya n'oge mgbe o nwara igbu onwe ya n'ọnwa gara aga.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Rex Features
Asọmpi Premier Lig amalitela n'uju ya dịka Man. City ji ọkpụ goolu ise asataghị otu were chie West Ham ọnụ n'ala.
Ebe otu Tottenham na Aston villa na-achịpụ ya ugbua ị ma mbe na abọ nke bụ oke.
Akụkọ BBC na nkeji
Anthony Joshua vs Andy Ruiz ga-esu n'ọnwa Decemba

Ebe foto si, Reuters
N'egwuregwu, n'abalị asaa nke ọnwa Disemba afọ a ka nwaafọ Naijiria bụ Anthony Joshua ga-enwe ohere ịnataghachị ugwu ya n'iti ọkpọ n'aka Andy Ruiz.
Dimkpa abụọ a ga-ezute onwe ha ọzọ na mba Saudi Arabia.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cheta na Ruiz kụpụrụ Joshua mkpụrụ ọkwụrụ n'anya mgbe ha zutere onwe ha n'ọnwa June, ma nara ya nturuugo IBF, WBA nakwa WBO o jibu.
Mana ụfọdụ ndị na-akwado Joshua na-agbarụ ihu maka na ọgụ Joshua na Ruiz ga a bụ na mba Saudi Arabia.
Ha kwuru na Saudi Arabia bụ obodo na-anaghị asọpụrụ ikike dịịrị onye bụ nke a kpọrọ 'human rights'.
Ndị ọzọ kwuru na obodo ahụ ga-etere ha aka ịga lelee ọgụ a ga-akpụ ọkụ n'ọnụ.
Nyocha ebidola

Ebe foto si, Nigeria Police
Isi ụlọọrụ nchekwa Naijiria a kpọrọ Defence Headquarters ehiwela otu ga-eleba anya n'ogbugbu ndị agha gburu ndị uweojii atọ na Taraba Steeti.
Nke a bụ iji mezu iwu Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ka e mee nyocha iji chọpụta ebe mmiri siri baa n'opi ụgbọgụrụ.
Ndị kọmiti ga-eme nnyocha a gụnyere ndị agha, ndị agha elu, ndị agha mmiri, ndị uweojii, ndị DSS na ndị Defence Intelligence Agency.
Cheta na ndị uweojii na-ebo ndị agha ebubo ịgbagbu mmadụ atọ ndị otu ha ma merụọ ndị ọzọ ahụ oge ha gara nwụchie onye ntọ a ma ama na Taraba steeti aha ya bụ Alhaji Hamisu.
Mana ndị agha kọwara na ha che na ndị uweojii ahụ bụ ndị ntọ n'onwe ha n'ihi na ha eyighi akwa ndị uweojii.
Ndị mba Turkey a tọọrọ n'oshimiri enwerela onwe ha

Ebe foto si, Getty Images
A tọhapụla ndị mba Turkey mmadụ iri bụ ndị a tọọrọ n'ụgbọ mmiri n'oshimiri dị nso na Naịjirịa n'izuụka atọ gara aga.
Ndị ahụ nọ n'ụgbọmmiri si Cameroon aga Ivory Coast oge ndị a na-eche na ha bụ ndị ekperima wakporo ụgbọ ha ma tọrọ ha.
Akụkọ kwuru na a tọhapụrụ ndị ahụ n'ụbọchị Satọdee na-akwụghị ụgwọ ọbụla.
Ọkaiwu ha aha ya bụ Selcuk Esenyel kwuru na otu a kpọrọ Niger Delta Peace Advocacy Group nakwa ndị Riverine Peace Initiative in Niger Delta tinyere ọnụ n'okwu ahụ.
North Korea agbaala ogbunigwe

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, mba South Korea na-ekwu na ndị North Korea gbara ogbunigwe elu abụọ n'ụbọchị Satọde,
Ọ bụrụ na ebubo a bụrụ eziokwu o gosiri na North Korea e nupula isi na mkpebi iri na otu nke ndị otu United Nations Security Council manyere ha gbasara ogbunigwe elu.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











