Army and Police: 'Ebee ka Hamisu Bala Wadume nọ?'- Ndị uweojii ajụọla ndị agha

Usman Danzumi, Mark Ediale nakwa Dahiru Musa

Ebe foto si, Nigeria Police

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Okwu gbasara ogbugbu ndị agha Naijria gburu ndị uweojii atọ na Taraba steeti aghọọla okwu nwunye di na ibe ya dịka ndị uweojii na-ajụ ndị agha sị ha kọwaa ebe Alhaji Hamisu Bala Wadume nọ.

Wadume bụ onye ndị uweojii na-ebo ebubo na ọ bụ onye ntọ a ma ama na-akpa ike na Taraba steeti nke ndị uweojii nwụchiri, mana ndị agha gbagburu ndị uweojii atọ ma tọghapụ ya n'okporoụzọ Ibi-Jalingo dị na Taraba Steeti.

Ndi uweojii ahụ e durala mmụọ bụ Usman Danzumi, Mark Ediale nakwa Dahiru Musa.

Mohammed Adamu na Tukur Buratai

Ebe foto si, NPF/Getty

N'ozi nke dị uweojii wepụtara n'akara Facebook ha na mgbede Tọzde abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst afọ 2019, ọnụ na-ekwuru ha bụ Frank Mba kwuru na ozi ndị agha Naijiria wepụtara gbasara mgbagbu ha gbagburu ndị uweojii atọ akwụghị ọtọ.

Col Sagir Musa bụ ọnụ na-ekwuru ndịagha kwuburu na ndịagha gbagburu ndị uweojii ahụ na amaghị ama dịka ha nwetara ozi na ndị ntọ kpụ ndị mmadụ na-agafe.

Mana Mba sara sị, "Alhaji Hamisu Bala Wadume bụ onye ntọ nwere nnukwu ego nke ndị uweojii nwụchiri mana ndị agha were ya dịka onye a tọọrọ ma 'gbapụta ya."

"Ugbua, kedụ ebe ọ nọ? Kedụ ebe onye ahụ ha gbapụtara nọ?"

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ajụjụ ndị ọzọ ndị uweojii na-ajụ bụ : " Kedụ ka onye ntọ e ji ịga jichie gbalahụrụ ndị agha bịara gbapụta ya."

" Ọ bụrụ na Alhaji Hamisu Bala Wadume bụ onye a tọọrọ atọrọ n'ezie, ndị agha gbapụta ya, gịnị mere na a kpụgaghị ya isi ụlọọrụ ndị aha iji dee ozi ihe mere ma gbaa ya ajụjụ dịka omenala ndị agha dị."

"Kedụ ihe mere na ndịagha gbara ha egbe na nsonso n'agbanyeghị na ha kọwara ha onwe ha dịka ihe onyonyo na-efegharị ugbu a na-egosi?"

N'ozi Mba wepụtaburu, o kwuru na ndịagha a gbagburu ndị uweojii ahụ na-agbanyeghị na ha ma na ha bụ ndị uweojii.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ka ọ dị ugbua, a ka na-eme nyocha maka ihe a mere.

Lee akwụkwọ ndị uweojii deputara si na ndịagha gburu ndị uweojii atọ ma tụghapụ onye ntọ ama ama ha jidere.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2