Boko Haram attacks: Ndịagha Naijiria ekwuola etu Boko Haram si gbuo ndịagha anọ

Ndị agha Naijiria

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị agha ahụ si Damaturu na-aga Maiduguri mgbe ha zutere ọnwụ ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndịagha Naijiria ekwetala na 'Boko Haram' gburu ndị otu ha mmadụ anọ n'ụbọchị Tọọzde.

Otu n'ime ha gunyere onye ji ọkwa "Colonel".

Ọnụ na-ekwuru ndịagaha bụ Ado Isa kwuputara nke a n'akwukwọ ozi o zipuru taa.

Isa kwuru na ndị agha ahụ si Maiduguri na-aga Damaturu mgbe ndị oyi egwu Boko Haram wakporo ụgbọala ha.

Nke a mere dịka ndị Boko Haram wakporo ogige ndị agha nke dị na Jakana, dịka ndị agha siri kwuo.

Ha bu ụgbọala 'truck' asaa na egbe ike di iche iche wee mee mwakpo a.

Mana ndị agha sị na ndị otu ha nọ n'ogige ahụ nyere ha ọsọ, ha gbahapụ otu ụgbọala nakwa egbe ndị ọzọ rie mbọmbọ.

Ọ bụ na akara Facebook ha ka ha dere ihe a.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ụlọọrụ ntaakụkọ AFP kwuru na ọbụ ndịagha mmadụ isii ka Boko Haram gburu, mana ndị ndịagha sị na ọ bụ mmadụ anọ.

AFP si na ọ bụ mmadụ abụọ ndị agha achọghị ka akpọ aha ha gbaara ha ama.

Ndị a kwuru na ndị Boko Haram ji egbe gbarie ụgbọala ndị agha ahụ ji eme njem.

Mgbe BBC kpọrọ ndịagha Naijiria iji mata nke bụ eziokwu, ha azaghị oku.

Tukur Buratai

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisi ndịagha Naijiria Tukur Buratai

Otebeghi aka onye ọchịagha ọhụrụ ezigara na Borno Steeti turu ọnụ na ya ga-ememina ndị Boko Haram.

Ọchịagha ahụ aha ya bụ Abdulmalik Bulama-Biu kwuru na ya ga-anyụ Boko Haram ịkpakwụ ma ha kpọọ ekwe nkụ na-aluso ndịagha ọgụ.

Ugboro ugboro ka gọọmentị Naijiria kwuru na ha emeriela Boko Haram mana otu abụ n'ezi.

Ebe ogbunigwe Boko Haram kpara ike.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ogbunigwe ndị Boko Haram ka na-ada kwa mgbe kwa mgbe na mpaghara 'North East'.

Onyeisiala Buhari ka na-etu ọnụ na ọchịchị ya emenyụọla ndị Boko Haram anya, mana nke ahụ abụchaghị eziokwu.

Ọbụ eziokwu na ndị Boko Haram anọghizi na akụkụ Naijiria nile dịka ọdịbu na mbụ, mana ha ka na-egbukwa mmadụ oge ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ugwu Naịjirịa.

Ọtutụ ụmụakwụkwọ Chibok bụ ndị Boko Haram tọọrọ kamgbe 2014 apụtabeghi ruo taa.

Abubakar Shekau

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Boko Haram ekewaala abụọ ugbua. Abubakar Shekau bụ onyeisi otu ụzọ

Boko Haram egbuola mmadụ karịrị 27,000 kamgbe ha malitere iyi ndị mmadụ egwu ihe dị ka afọ iri gara aga.

Ka ọ dị ugbua, ndị Boko Haram ekewaala abụọ, otu ngalaba esonyerela ndị otu "Islamic State".

Ha kpọrọ onwe ha "ISWAP" nke pụtara "Islamic State in the West African Province".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Morocco nwa Maduka: