Ndịagha Naịjirịa agọọla na onweghị ndị otu ha Boko Haram gbụrụ

Maiduguri dị na Naịjirịa bụ ebe agha kacha ada ụda

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Nkọwa foto, Maiduguri dị na Naịjirịa bụ ebe agha a kacha ada ụda

Ndị agha Naịjirịa etinyela ọnụ n'akụkọ si n'ụlọ ntaakụkọ AFP pụta na ndị omekome Boko Haram wakporo ngige ndị agha n'obodo Zari, nke di n'okpuru ọchịchị Guzamali dị na Borno steet.

Onye na-ekwuchiri ndị agha nọ n'atụmatụ ha ji ebuso Boko Haram agha bụ Lafiya Dole bụ Onyema Nwachukwu kwuru ọ bụ eziokwu na ndiagha na ndị Boko Haram kwara mgbọ, mana ọbụghị eziokwu na ndịagha ruru iri atọ nwụrụ.

Nwachukwu kwuru na ọ bu ndị Boko Haram ka ndị agha gbụrụ na ya bụ akwam mgbọ.

Okwu Nwachukwu bụ na akụkọ AFP, nke kwuru na ọtụtụ ndi Boko Haram ji ụgbọala wakporo ya bu ngige ndị agha wee nata ha ya nwantintin oge ka ha gbụru ndị agha iri atọ, akwụghị ọtọ.

Nwachukwu sị na ha enwetebeghi ozị banyere ndị nwụru na ya bụ mwakpo, mana ọbụghị eziokwu na mmadu iri atọ nwụrụ'.

Akụkọ a pụtara ka ndị Boko Haram na-eme ọtụtụ mwakpo na ngige ndị agha na Bornu, na-azụ ka ndi agha na gọọmentị Naịjirịa na-akọwa na ha emeriela ndị Boko Haram na atụmatụ ha kpọrọ 'technicallly' n'asụsu Bekee.

Nwachukwu kwukwara na akụkọ AFP ekwụghi ihe mere, dika na ọ bụ obodo Zari ka ndị omekome ahụ wakporo, nke mere ndị agha nọ na gbụrụgbụru ahụ jiri ga-ibuso ha ọgụ,

"Anyi gbụrụ ọtụtụ ndị Boko Haram, ma nata ha ngwa agha ha,' Nwachukwu kwuru.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ