Ndị Enugwu ayọọla gọọmenti ka ha gbatikwuo ụbọchi inweta PVC

Aha onyonyo, Iwe ji ndị anatabeghị PVC n'Enugwu

Inweta PVC n'Enugwu dịka ịnyịnya ịgafe n'ọnụ aga, dịka nchọpụta BBC Igbo mere.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụọnụ n'ogige isi ụlọọrụ Enugwu Sentralụ kwara arịrị na kemgbe ụbọchị ole ma ole na ha enwebeghị ike inweta PVC.

Ha boro INEC ebubo na e nwere ihe ọjọọ ha bu n'uche mere ha jị eke ya na naanị otu ebe n'okpuru ọchịchị ọbụla. Nke a mere ha ji agabiga ahụhụ inweta ya.

N'Owo bụ ebe ndị Enugwu North n'ewere nke ha, ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'mmiri nakwa anwụ na-eche ma ha ga- enwe mmeri.

Ndị na-achọ ịnata PVC
Nkọwa foto, Inweta PVC n'Enugwu dịka ịnyịnya ịgafe na-ọnụaga

Nwabueze Adimchi bụ onye gbara afọ iri n'itoolu kwuru na nke a bụ izizi ya chọrọ inweta ya bụ PVC wee kwaa arịrị na ya chọrọ iji ya tụọ vote nke mbụ na ndụ ya.

Ndị ọzọ gunyere Caleb Obi, Cosmas Anyanwu jị obi mwute gwa gọọmentị ka ọ nyekwuo oge ka nweta nke ha.

Kirie ma gee ihe ha kwuru na ihe nkiri dị na-elu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: