Boko Haram: Ndịagha Naịjirịa agbanwela onyeisi agha ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndịgha Naịjirịa ahazigharịala ndịisi Lafiya Dole, bụ atụmatu ha ji ebuso Boko Haram agha.
Nke a bụ ugbo anọ e wepụrụ onyeisi Lafiya Dole n'ime ọnwa iri na anọ, nke ndị ma maka ya kwuru bụ maka mwakpo ndị Boko Haram wakporo ndịagha na nso nso a.
Ike a ndị Boko Haram malitere na-akpa bu ihe nwereike imetụta Muhammadu Buhari na ntuliaka nke ga-eme n'ọnwa Febụwarị nke afọ na-abịa.
Cheta na imeri Boko Haram so na nkwa Buhari kwere mgbe ọ na zụọ ọchịchị n'afọ 2015.
Agha a na-ebuso Boko Haram abanyela afọ iri, mana nsogbu sitere n'ime ya pụta, ọkachasi nke metụtara ndị mmadụ na mpaghara Naịjirịa agha na-eme, adịghị ka ihe chọrọ ịkwụsị.
Mana nhazigharị a, nke e mere Major General A.M. Dikko onyeisi Lafiya Dole, bụ nke ndịagha chere na ọ ga-eme ka olileanya onyeisi agha Naịjirịa bụ Lieutenant General Tukur Buratai bụru ihe a hụru n'anya.
Akụkọ nhazigharị a pụtara n'ozi ndiagha Naịjirịa zipuru.
Ha ekwụghị ihe mere Rogers Nicholas, bu onye ndụ Lafiya Dole kemgbe ọnwa Decemba nke afọ gara aga mana ndịagha a gbara ajụjụọnụ kwuru na obi adịghị Buratai mma maka mwakpo Boko Haram wakporo Borno na Yobe na mbido ọnwa.
"Na Yobe, otutu ndịagha anyị nwụrụ, otutu ngwa agha furu. Mwakpo a bu mkparị n'ebe onyeisi anyị nọ, ọ na-eche na ọ bụ mmeghe site n'aka nkwado anyị," ụfọdụ ndịagha kwuru.
Gọọmentị Buharị nọ na-ekwu kemgbe Disemba 2015 na e meriela Boko Haram n'atụmatu Bekee kpọrọ 'technically'.
Mana, mwakpo ebibeghị ka ndị oyi egwu a kpọrọ Islamic State of West Africa na Bekee ka ji ala na gbụrụgbụrụ Lake Chad.

Ebe foto si, Getty Images
Na ebe ọzọ na Naịjirịa, mwakpo na-eme n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ụgbọ egbuola mmadụ karịa nke Boko Haram gburu n' afọ a, dịka otu International Crisis Group kwuru.










