Google enyela Naijiria ohere inweta intanet n'efu

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa bụ otu mba n'ime ise so na ndị ga na-erite elele inweta intanet n'efu site n'atụmatụ ụlọọrụ Google a kpọrọ 'Google Station initiative.'
N'ime atụmatụ a, a ga-ekesa ebe nweta ịnatanet narị abụọ n'obodo mepere emepe ise n'otu afọ.
Ụlọọrụ Google ebidola atụmatụ inye ụmụ Naịjirịa intanet n'efu.
Google na ụlọọrụ na-arụ ụdọ igwe okwu fiber optic telecom service provider a kpọrọ 21st Century na-ejikọta ọnụ ikwado ọnọdụ maka inweta inanet n'ụlọakwụkwọ kọlej, ọdọ ahịa na ọdọ ụgbọala.
Dịka ụlọ akụkọ CNN siri kwuo, Google agaghị akwụ ndị ụlọọrụ a maọbụ ndị nwe ebe a na-enweta ịntanet n'efu ụgwọ kama ha ga na-ekiri ka ego ha nwetara site na mgbasaozi azụmahịa.
Onye ndu atụmatụ ahụ bụ Caesar Sengupta, kwuru sị na mmadụ ijeri ana-atụ anya isonye na iji ịntanet eme ihe agbanwewela ịntanet n'ụzọ atọ doro anya nke gụnyere iji naanị ekwentị enweta ihe na intanet nakwa inwe mmasi n'ihe gbasara ihe na-eme n'akụkụ ụwa onye nọ.
Tupu google bute atụmatụ nke o bu n'obi ịgbasa n'Afrịka, ha mepere atụmatụ a na mba India, Indonesịa, Mexico nakwa Thaịland.
Cheta na Facebook mepere nke ha n'ọnwa Novemba afọ 2017.










