Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị Boko Haram 5 na Sambisa

Ebe foto si, Getty Images
Ndi agha Naịjirịa nọ na-ebuso ndị ọmekataraihepụụjọ a na-akpọ Boko Haram agha na ọwụwa anyawụ ugwu Naịjirịa na-akọwa na ha gburu ndị Boko Haram ise na ọhịa Sambisa.
Onye bụ osote onye na ekwuchitire ndị agha Naịjirịa na ngalaba nke 'Operation Lafiya Dole' bụ Kọnel Onyeama Nwachukwu kwuru na Maiduguri na ndị agha Naịjirịa nọ ọrụ na Sambisa nwụchịkọrọ otu onyeisi Boko Haram ma tọhapụ mmadụ atọ ha jị eji.
Ihe ọzọ ndị agha jidekwara bu ụgbọala na nnukwu egbe na mgbọ ndị Boko Haram jị akpa ike.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ha gbukwara ndị agha Boko Haram ụfọdụ mgbe ha na ekpocha ọdọ Boko Haram ha kpọrọ 'Sabil-Huda' di n'ime ọhịa Sambisa.
Konel Nwachukwu kwuru na ndị agha Naịjirịa abụọ merụrụ ahụ ka ha nọ ọrụ a.
Nwachukwu sị na ndị agha Naịjirịa bidoro ịbuso ezumezu Boko Haram akpọrọ 'CAMP ZAIRO' agha nke a na Frịde, agbanyeghị na ogbunigwe ndị Boko Haram niri n'ala mebiri ụgbọala ha ji alụ ọgụ ahu.
Konel Nwachukwu kwuru na ha nwetere otu ogbaatumtum, igwe abụọ, ọkọrọtọ Boko Haram ato, igbe ise nri oka di n'ime ha, egbe AK47 otu, na ihe ndị ọzọ dị icheiche.

Ebe foto si, AFP
Cheta na Boko Haram na akpa ike na gburugburu ọwụwa anyawụ dị icheiche. Na ịzụụka gara aga, ha wakporo ụlọ akwkwọ dị na Dapchi na Yobe steeti we nwụchịkọrọ ihe ruru ụmụakwụkwọ otu nari na ise.








