Ọgụ mba Kameruun bụ nsogbu ndị Krọs Riva nwere - Ayade

Ebe foto si, @crossriverstate
Gọvanọ Krọs Riva steeti bụ Ben Ayade etiela mkpu n'oke olu na ndị Ambazonia chọrọ nwereonwe site na Kameroon na-ebubata ngwaagha na Naịjirịa.
O kwuru na ndị Ambazonia a na gọomentị mba Kameruun na-esi n'oke karịrị iri abụọ na asaa dị n'etiti Kameruun na Naịjirịa ebubata ngwaagha ndị a.
O kwuru nke a na ngwụcha mkparịta ụka nchekwa ha mere na Krọss Riva Steeti ebe ọ katọọrọ ndị ọrụ nchekwa maka nsogbu dị n'oke ha na ndị Kameruun.
Mgbe BBC gbara ọnụ na-ekwuru gọvanọ Ben Ayade bụ Christain Ita ajụjụ, na nke a bụ eziokwu na oke dị n'etiti steeti ahụ na Kameruun enweghi ezigbo nchekwa ọbụla.

Ebe foto si, @Govamba-twitter
O kwuru na nke a mere ndị a ji na-abata na Naịjirịa na-ewe ụmụ Naịjirịa n'ọrụ isonye ha lụọ agha dị na kameruun site n'ibunye ha egbe na ngwaagha.
Ihe gọọmentị etiti kwesiri ime;

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na gọvanọ Ayade edegarala onyeisiala bụ Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi banyere nke a, na-arịọkwa ka gọọmentị etiti gbatara ha ọsọ n'ichekwa oke ndị a.
O kwuru na steet na-agba mbọ nke ya site n'ike ajị n'ume ịhụ na-ebelatara oke mpụ nke mbubata ngwaagha ndị a na-ebute.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






