Minimum Wage: Anyị ga-akwụ ya mana gọọmentị etiti ga-enyere aka - Steeti dị n'ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Ihedioha/Ikpeazu/Obiano/Umahi
Dịka Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari nyere iwu ka ebido kwuwa ndị na-arụrụ gọọmenti etiti ọrụ ụgwọ ọnwa opekatampe N30,000, ihe ndị mmadụ na-ajụ bụzị:Kedụ mgbe ndị steeti ga-ebido soro ṅụwa mmiri ọma ahụ?
BBC juru ndị steeti dị n'Ọwuwa Anyanwụ ebe ha kwụ na imezu nkwa ịkwụ ndi orụ steeti ụgwọ a.

Ebe foto si, Getty Images
Lee ihe ha nwere ikwu :
Abia Steeti ga-akwụ ụgwọ opekete mpe N30,000

Dịka BBC na Onyebuchi Ememanka bụ onyeisi Ntaakụkọ nke Abia Steeti kpara nkata, o kọwaara na Abia steeti agaghi enupuisi dịka edebaala ụgwọ a n'iwu Naịjirịa.
O kwukwara na steeti niile nwere ọpụrụ iche nke ha dị iche iche, ma bụru kwa n'obi na ndị orụ Abia Steeti ga-enwe nghọta ebe gọọmenti Abia steeti nọ.
Ememanka kwukwara na ugwọ opekatampe nke mbu gọomenti etiti hibere, na Abia Steeti gbaliri kwuo ya.
Anambra Steeti

Don Adinuba bụ Komịshọna na ahu maka igbasa ozi n' Anambra steeti ekwuola na Anambra steeti ga-akwụ ugwọ opekatampe a.
Kama ha na-eche ka ndị Gọọmenti etiti ngalaba nke na-ahu maka ọrụ tuziere ha aka etu a ga-esi kwụọ ụgwọ a.
Ngwa lee otu ụgwọ ndị ọrụgọọmenti Naịjirịa si tụnyere nke mba ndị ọzọ n'Afrika

Ebonyi Steeti

Onyeisi na-ahu maka mgbasa ozi na Ebonyi Steeti bụ Emmanuel Uzor ekwuola na Ebonyi steeti ga-akwu ma steeti ndị ọzọ bido kwụwa.
Ọ na-ekwukwa ka gọọmenti etiti tinye anya n'ihe gbasara etu esi eke ego steeti.
Ma ka gọọmenti etiti nwelite ego a na-enye gọọmenti steeti ka ọ zuo iji kwụọ ugwọ opekatampe a.
Imo Steeti

Chibuike Onyeukwu bụ onyeisi na-ahu maka mgbasa ozi n'Imo steeti kwuru na Gọvanọ Ikpeazu nwere ọ dị nma ndị ọrụ Imo steeti n'obi nke ukwuu.
O kwuru na Govanọ Ikpeazu agaghị ekwe nkwa ihe ọ na agaghi emezu, kama na gọọmentị Imo ga etinye anya n'akwụkwọ ego steeti were nwee nzuka na etiti ha na ndị ọrụ Imo steeti ka ha mara otu ha ga esi gaa n'ihu maka ugwọ opekete mpe a.










