Minimum wage: Anyị ga-akwụ ihe ọbụla ụlọomeiwu etiti kwadoro n'iwu - Kọmịshọna mgbasaozi

Willie Obiano

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Anambara steeti ekwupụtala njikere ha dị n'itinye n'ọrụ mkpebi ọbụla ụlọomeiwu etiti ga-eme n'ụzọ iwu gbasara ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ obodo.

Otu ọgbakọ nke otu atọ mejupụtara, nke a kpọrọ 'tripartite Committee' nke gọọmentị etiti hiwere mabụrụkwa nke Ama Pepple nọ n'isi ya, nọọrọ n'afọ gara aga kwupụta ka puku naịra iri atọ bụrụ ụgwọọnwa opekatampe e kwesiri ịkwụ ndịọrụ obodo Naijiria.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Kọmịshọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasaozi bụ Chukwuemeka Adinuba gwara BBC Igbo n'ekwentị na " Anyị kwetara na ego a na-akwụ ndịọrụ anaghị ezu. Ihe ọbụla ụlọomeiwu etiti kwetara anyị ga-akwụ ya."

Ndịọrụ na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndịọrụ Nigeria na-esi ọnwụ na ụgwọ opekatampe ga-abụlrịrị N30,000

Onye odeakwụkwọ ukwu nke steeti ahụ bụ Solo Chukwulobe nọọrọ ụbọchị Tuzde oge ndịọrụ mere ngagharịiwe na steeti ahụ ma kwupụta na ndịọrụ obodo kwesiri ka e bulitekwuo ụgwọọnwa opekatampe ha, ma lebakwuo anya n'usoro akụnaụba nke Naijiria ka ọdị taa.

Cheta na Minista na-ahụ maka ndịọrụ bụ Chris Ngige nọọrọ n'ọgbakọ ya na ndịndu otu ndiọrụ mere, kwee nkwa na gọọmenti etiti ga-anọ n'abalị 23 nke ọnwa Jenụwarị, 2019, ma wegara ụlọomeiwu etiti Naijiria atụmatụ iwu ndịọrụ ka ha leba ya anya.

Akụkọ ga-amasị gị: