Ndị ọrụ ntaakụkọ n'Abia steeti akwala arịrị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ kachasị mkpa taa:

Ngagharịiwe ndị ntaakụkọ n'Abia Steeti

Ụlọọrụ ndị mgbasa ozi nke gọọmenti Abia steeti nwere.

Ebe foto si, BCA/Facebook

Otu ndị ụlọọrụ mgbasa ozi nke gọọmentị Abia steeti bụ Broadcasting Corporation of Abia State (BCA) enwetela ọsịsa n'aka gọọmenti Abia site na ngagharịiwe ha mere maka nchabi ụgwọ ọrụ ha.

Ndị ụlọọrụ ahụ kwuru na gọọmenti Abia steeti malitere ịchabi ụgwọọnwa ndị ọrụ ha kamgbe ọnwa Julaị afọ 2015.

Onyeisioche otu jikọtara ndị ọrụ ahụ bụ Nji Joseph kwuru na gọọmentị ekwela nkwa ikwuzu ụgwọ ọnwa ha malite na nke ọnwa Ọgọstụ.

Ndị uweojii anwụchiela onye gbara akaebe ụgha

Ibrahim Idris

Ebe foto si, Alamy

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadu na-ebo Ibrahim Idris na ndi uwe ojii na ha enweghị ike ị kwusị ọgbaghara na Naijiria

Ndị uweojii agbala otu nwoke bụ Ismail Yakubu n'anwụ maka ịgba akaebe ụgha megide Edwin Clark nke mere ha ji wakpoo ụlọ ya dị n'Abuja.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Yakubu kwuru na onweghi ihe ọjọ o mere, na ọ bụ kepukepu ọ nụrụ ka ọ gwara ndị uweojii.

Na mba ọzọ

Ụgbọelu ndị uweojii ka ọ na-azọ ndụ ndị tọrọ n'ụlọ ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ atọ bụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ anwụọla ebe ha na-agbanyụ ọkụ na-ere n'ụlọ ogologo dị na Johannesburg na mba Saụt Afrịka.

Otu onye si n'elu daa ma nwụọ, ebe abụọ ndị ọzọ nwụrụ n'ime ụlọ ahụ.

N'egwuregwu,

Ndị nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ na Yorup

Ebe foto si, Getty Images

Ndị nchịkọta otu egwurewgwu bọọlụ na Yorupe akpọọla oku ka akachapụ iwu na-asị na inye goolụ n'ọgbọ ndị ọzọ dị mkpa nke akpọrọ 'Away goal' na bekee.

Ha kwuru na iwu a na-eme ka otu egwuregwu bọọlụ na-akpachị ọgbọ ha ma ghara ịgba ezigbo bọọlụ.

Gere nkeji nke taa:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri taa:

Onye ọkaiwu ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Ugo Egbujo ekwuola na e nwere ụzọ kacha mma Ndigbo inweta Biafra ha na-achọ na-alụghị ọgụ ọbụla.

Aha onyonyo, 'Restructuring' ka mma karịa referadum