Ndịọrụ Fidelity Bank : Ihe mere anyị jiri mee ngagharịiwe

Aha onyonyo, Lee ngagharịiwe ndịọrụ ụlọakụ Fidelity mere maka ụgwọ e ji ha

Ndịọrụ ụlọakụ Fidelity mere ngagharịiwe ụbọchị Tuzde n'isi ụlọọrụ ụlọakụ ahụ dị na Kofo Abayomi nakwa ụlọakụ ha dị n' Ahmadu Bello Way na Victoria Island, Legos.

Na ngagharịiwe a nke yiri nke ha otu izuụka gara aga, ha boro ebubo na ụlọakụ ahụ akwụghị ha ụgwọ ọnwa iri nakwa ụgwọ a na-akwụ onye si n'ụlọọrụ ahụ apụ nke a na-akpọ 'severance package' na Bekee.

Ndị ọrụ Fidelity Bank na-eme ngagharịiwe

Ndị ọrụ ahụ ndị ọtụtụ bụcha ndị obere ọkwa ruru iri atọ na-agụ egwu e ji mara ndị ọrụ iji gosi iwe ha.

Ha bukwa akwụkwọ na-egosi iwe ha na-ekwu; 'Kwụọ anyị ụgwọ ịgbara ụlọakụ a odibo afọ iri na isii' 'Kwụọ anyị oke ruru anyị', 'Fidelity Bank, anyị rụtara ego a', 'obi ọjọọ a akarịala.'

Na mkparịtaụka onye ntaakụkọ BBC na ụfọdụ n'ime ha nwere, ha boro Fidelity bank ebubonja ha jụrụ ịkwụ ha ụgwọọnwa ọnwa iri nakwa ụgwọ a na-akwụ onye na-apụ apụ.

Ndị ọrụ Fidelity Bank na-eme ngagharịiwe

Innocent Eluwa onye kwuru na ya rụọlọra Fidelity Bank ọrụ afọ 12 boro ebubo na ụlọakụ ahụ wetara atụmatụ ịchụ ha niile na akwụghị ụgwọ. Mana ka ha mechara ngagharịiwe, "Ndị ụlọakụ ahụ kwetara ịkwụ N100,000 maka otu afọ n'ime afọ ole onye ọbụla rụrụ ha ọrụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na Fidelity kwụrụ ụfọdụ ma hapụ ụfọdụ ndị ọ na-ekwụ bụkarịrị ndị so na ngaghariwe ha meburu na mbụ.

Ndukwe Samson kwuru na ya so na ndị si Manny Bank banye Fidelity oge e jikọrọ ụlọakụ ahụ ọnụ.

Samson sị na ihe ha chọrọ bụ ka: "Ha kwụọ anyị ụgwọ ọnwa ọnwa iri ha ji anyị, nyekwa anyị oke ruru anyị nke bụ N100,000 maka otu afọ n'ime afọ ole onye ọbụla rụrụ ha ọrụ."

N'okwu ya, onyeisi ndị uwe ojii mpaghara ahụ kelere ha maka ịkwanyere onwe ha ugwu ghara imebi ihe oge ha na-eme ngaghari iwe.

Ndí na-eme ngagharí iwe

Mana ndị na-ekwuchitere ụlọakụ ahụ bụ Charles Aigbe na Ejike Ndiulo gwara BBC na ndị ahụ na-eme ngaghariwe abụghị ndị ọrụ ha kama ha bụ ndị na-arụrụ ụlọọrụ anyị na ha na-arụkọ (outsource company).

Aigbe bụ onyeisi ngalaba mgbasaozi n'ụlọakụ sịrị; "Ndị ọrụ a ị na-ahụ abụghị ndị ọrụ Fidelity Bank. Ebubo ha achịtaghị aja. Ha bụ ndị ọrụ ụlọọrụ na-arụbụrụ Fidelity Bank ọrụ. Ha bụ ndị ọkwọụgbọala na-arụburu ụlọọrụ ha ọrụ."

N'otu olu ahụ, Ndịụlọ kwukwara na ndị mere ngagharịiwe ahụ bụ ndị ọkwọ ụgbọala ndị ụlọọrụ ha na ha na-arụkọ chụrụ n'ọrụ.

"Ha abụghị ndị ọrụ anyị. (Egwu iji gosi iwe...) Ngagharịiwe ndị ọrụ Fidelity ị hụrụ bụ maka na ụlọakụ wetara atụmatụ ọhụrụ nke adịghị mma nke kwuru ka achụ ndị ọrụ niile ma n'Abụja ma na Pọtakọt n'ebe niile were mee ngagharịiwe. Ndị isi ụlọakụ were zukọọ kwekọta na ha ga-akwụ onye ọbụla potu narị puku naira n'otu afọ gbakọta afọ ole onye rụrụ ọrụ n'ụlọakụ ahụ.

Otu onyeisi a na-akpọ Madam Chijioke Okechukwu nwere kpọọ anyị gwaa anyị ihe ekwekọrita.

"Ndị a abụghị ndị ọrụ ụlọakụ Fidelity. Ọ bụghị Fidelity were ha n'ọrụ.

"Ị bia n'ụlọakụ Fidelity, anyị nwere ndị na-azara anyị ihe, ndị na-ekpocha ahịhia. Ndị a bụ 'vendors' ka a na-akpọ ha na bekee. O nwere ụlọọrụ kpọtara anyị ndị na-anyara anyị ụgbọala.

"Oge ụlọakụ Fidelity kwuru na anyị achọzighịkwa ndị ọkwọụgbọala, anyi sị ha lọchaghịkwa ụlọọrụ nwe ha. Ọ gwụla.

"Ụlọakụ Fidelity bụ ezigbo ụlọọrụ n'ala Naijiria. Onye ọbụla bụ onye ọrụ anyị pụọ n'ụlọakụ Fidelity, a ga-enye ya oke zuru ya, ya ewere lawa."