Fidelity Bank: Ọ bụghị onyeisi ọrụ anyị tiri ndị mmadụ ihe

Ihe nkiri na-efegharị n'intanet na- ekwu na onyeisi ọrụ Fidelity Bank n'otu ụlọọrụ ha nọ na Kola dị na Legos, nyere iwu ka ndị uweojii kụọ ndịahịa ha bịara iwere ego ihe n'ihi na ha kwara arịrị etu ihe si aga n'igwe ego dị n'ụlọakụ ahụ.
Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ndị uweojii nyere iwu ka ụmụnwoke abụọ nọrọ alal n'ala nkiti ma na-etikwa ha ihe na enweghị mgbochi ọbụla.
Mana ụlọakụ ahụ agọọla na o nweghị eziokwu dị na ya bụ akụkọ.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ ahụ bụ Henry Ndiulo kwuru na o nweghị onyeọrụ ha nyere iwu ọbụla ka ka e tie ndịahịa ha ihe.
"O nweghị onyeisi ụlọakụ anyị sị ndị uweojii kụwa ndị mmadụ ihe."
Na nkọwa ya,mmadụ abụọ e gosiri n'ihe onyonyo ahụ na-enyo akara ndị bịara iwere ego n'igwe ego dị n'ụlọakụ ahụ, ndị ọrụ nchekwa ha nọ ọrụ gwara ha ka kwụsị, ha bidoroe luso ha ọgụ merụọ ya ahụ nke mere ka ndị uweojii a hụrụ n'ihe nkiri ahụ gboo ọgụ ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ulọakụ ahụ enyefela nmmadụ abụọ ha na-ebo ebubo n'aka ndị uweojii.
Mana ndị mmadụ na-ekwu na Twitter n'ihe video kwuru na nke ụlọakụ ahụ kwuru dị iche.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ụfọdụ gosikwara iwe na ọsịsa Fidelity nyere ebubo ahụ.
@Timotebz jụrụ maọbụ ihe kwesiri ka ndị nchekwa ụlọakụ ahụ tie onyeahịa ha ihe maka inyo akara mmadụ n'ogige ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Akụkọ ga-amasị gị








