Ruga Settlements: Tupu mmadụ azụọ ala buru ibu n'Abia, anyị ga-amata ihe o ji ya eme - Kọmishọna

Ebe foto si, Getty Images
E jighị ihe a na-agba na ntị agba n'anya.
Nke a bụ ihe gọọmentị Abia steeti na-ekwu banyere atụmatụ 'Ruga Settlement' nke gọọmentị etiti wepụtara na nsonso ma kwụsịkwa ya.
Iwu ọhụrụ e tiri na steeti ahụ bụ na tupu onye ọbụla azụọ ala ruru hekta ise, ọ ga-akọwara gọọmentị ihe o ji ya eme.
Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ John Okiyi kọwaara BBC ihe kpatara e ji tie iwu a.

Ebe foto si, John Okiyi
Okiyi kwuru na Abịa bụ steeti nke abụọ maọbụ nke atọ ala ha kacha dị nta na Naijiria.
Ya mere, "anyị enweghi ala anyị jị akọ nri, ma ya fọdụ nke e ji eme 'Ruga' maọbụ 'cattle colony'".
Ọ gara n'ihu kọwaa na gọọmentị Abia chọrọ ka ndị mmadụ bịa mepee ụlọọrụ dị icheiche na steeti ahụ mana Ruga esoghị ya.
O kwuru sị: "Onye chọrọ iji ego achụ ego, ya bịa n'Abia steeti, anyị ga-anabata ya.
"Anyị ga-enye ya afọ ise sị ya akwụla ụtụ isi, mana anyị achọghị ihe nwere ike iwetara ndị obodo anyị ọgbaaghara na ọnwụ."
Ihe di iche na Ruga na 'Cattle Market'

Ebe foto si, Jacob Silberberg
Okiyi kọwara na ndịiche buru ibu dị n'etiti Ruga na ahịa ebe a na-ere ehi.
N'okwu ya: "Anyị amachighi mmadụ ire ehi.
"Onye chọrọ ire ehi ga-eji ụgbọala buru ehi ya bute n'ahia ebe a na-ere ehi.
"Anyị nwere ọgbọ ehi n'Aba, na Lopkanta, na Garki n'Umuahia na ebe ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
"Onye buru ehi ya bịa, rechaa, ọ laghachikwa ebe o si bịa.
"Anyị achozighi ndị na-akpụ ehi akpagharị, emebiri anyị ihe anyị kụrụ n'ugbo."
Mana Ruga, dịka Okiyi si kọwaa, bụ ebe ndị ọchịehi ga-ebi ebi, ga-adị ka obodo nke aka ya, ebe gọọmentị steeti enwekwaghị ikike ọbụla.
"Mba! Anyị achọghị ụdị ahụ."
Akụkọ ndị ga-amasị gị:










