Boko Haram crisis: Amerịka enyela Imam zọrọ ndị ụka Kraist 200 ndụ nturuugo

Mba Amerịka etunyela ụkọchukwu alakụba bụ Abubakar Abdullahi ugo "Religious Freedom Award" maka nzọpụta ọ zọputara ndị nke Kraịst 200 na Platu steeti mgbe ọgbaaghara dapụtara n'afọ 2018.
Onyeisiala Muhammadu Buhari kelere Abdullahi ma kwuo na ugo a tụnyere ya kwesịrị ekwesị.
Cheta na Abubakar dị afọ 83, zọrọ ndị otu uka Kraist ndị a oge ndị na-achi ehi buru egbe bata ụlọekpere ya n'obodo Nghar, n'ime Barkin Ladi na Platu steeti, na-achọ ndị ha ga-egbu.
Anambra steeti ga-achụ ndị nkuzi etozughị etozu

Ebe foto si, Willie Obiano/Twitter
Anambara steeti kwuru na ha ezipụrụla ndịisioche na odeakwụkwọ ngalaba ụlọọrụ 'Post Primary Schools Service Commission (PPSSC) nakwa 'Anambra State Universal Basic Education (ASUBEB)' akwụkwọ.
Kọmishọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba onye kwuru na nke a bụ eziokwu, kwuru na dịka steeti agụmakwụkwọ dị oke mkpa, Anambra na-eme nke a iji gbaso ntuziaka gọọmentị etiti.
"Ọ bụghị anyị tiri iwu ahụ kama ọ bụ gọọmentị etiti tiri iwu ahụ."
"Anyị ejighị ihe gbasara agụmakwụkwọ egwu egwu n'Anambara."
Adinuba kọwara na onye nkuzi tozuru etozu na steeti ahụ ga-enwe, opekatampe asambodo 'Nigeria Certificate in Education (NCE)'.
"Opekatampe akwụkwọ ntozu nkuzi nke Naijiria niile bụ nzere 'TC2' mana nke Anambara bụ 'NCE.'
Ncheta ụbọchị Nelson Mandela

Ebe foto si, Getty Images
Taata(Julaị 18) bụ ụbọchị a na-echeta Nelson Mandela bụ onye lụrụ ọgụ maka nwereonwe ndi mba Saụt Afrịka ma mechaa chia ka onyeisiala ha .
A na-eji ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Julaị echeta ya makana ọ bụ ụbọchị a mụrụ ya.
Mikel Obi eferela ịgbara Naijiria bọọlụ aka

Ebe foto si, Getty Images
Ọgbabọọlụ a ma ama bụ John Mikel Nchekwube Obi ekwupụtala hoo haa na ya achịsala ọwa dịka onye egwu bọọlụ Naijiria.
Mikel so Naịjirịa turu ugo dị iche iche nke gụnyere ibuli Iko Mba Afrịka n'afọ 2013, ọlanchara n'olimpiks afọ 2018 nakwa nke Iko Mba Afrịka o nwetara n'abalị ụnyaahụ ya na ọlaọcha o nwetara n'asọmpi ndị ntorobịa Mbaụwa n'afọ 2005.
Gee akụkọ ndị a na ntị gị n'otu nkeji ebe a:
Gbachịnụ ndị otu 'Northern Elders Forum' nkịtị - Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadụ Buharị sị ndị Fulanị ọchịehị egekwala ntị n'oku ndị otu "Northern Elders Forum" na-asị ha si mpaghara ndịda Naijiria lọtawa.
Buhari kwuru na iwu Naijiria nyere onye ọbụla ikike ibi na mpaghara maọbụ obodo ọbula masịrị ya.
Uweojii anwụchiela ndi ntọọ n'Abia

Ebe foto si, Getty/AFP
Ndị uweojii n'Abia steeti anwụchiela mmadụ iri asaa na asaa a na-ebo ebubo ịtọ mmadụ nakwa iso n'otu nzuzo.
Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ene Okon kwuru na ha nwụchikwara otu onye dibịa bu onye na-agwọrọ ndị ntọrị ahụ ọgwụ.
Ebola na Congo bụzị ọrịa gbata gbata n'ụwa

Ebe foto si, AFP
Otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation ekwuola na ọrịa Ebola na mba DR Congo bụzị ihe Bekee kpọrọ 'International Emmergency'.
WHO kwuru na Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ dị otu puku na narị isii kamgbe ọ malitere ọzọ na mba ahụ n'afọ 2018.
Nwoke si Saụt Afịrịka soro okporoụzọ gawa Ijipt ikiri asọmpị Afcon

Ebe foto si, Alvin Zhakata
N'egwuregwu, Alvin Zhakata onye Zimbabwe abụrụla onye mbụ gbara n'okporoụzọ si mba Saut Afrịka gaa Egypt, iji sonye na iko mba Afrịka nke afọ a.
Nke a mere ka onyeisi egwuregwu bọọlụ na Afrịka nye ya akwụkwọ iso lelee asọmpi AFCON nke ikpeazu nke ga-adị n'etiti Senegal na Algeria ụbọchị Fraidee.












