Anambra doctors strike: Ego a na-akwụ ndị dọkịta dị obere mana ha nwee ndidi

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Ọ bụghị zi akụkọ na ndị dọkịta Anambra Steeti ka nọ n'abụbụọrụ nke ha malitere kamgbe izuụka asa gara aga.
Ọtụtụ ihe bụ ihe ha gụpụtara bụ iwe mere ha ji na-agba abụbụọrụ.
Gịnị bụ iwe ha?
Onyeisi ndị Dọkita n'ụlọọgwụ OOUTH bụ Aniagbaoso gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe bụ iwe ha.
- O kwuru na ego ole gọọmentị Anambra na-akwụ ndị Dọkịta abụghị ihe a na-ekwu n'ọnụ na ọ dị obere.
- Ọzọ bụ na anaghị zi ebuli ha n'ọkwa dịka o kwesiri nakwa mgbe oge ya ruru.
- Enweghi ezi akụrụngwa eji arụ ọrụ n'ụlọọgwụ ha dị iche iche.

Kọmishịona na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra Steeti bụ Don Adinuba tinyere ọnụ n'okwu a n'aha gọọmenti.
N'okwu ya "Gọvanọ Willie Obianọ maara na ego a na-akwụ ndị dọkịta abụghị ihe ekwesiri ịkwụ ha, ya mere o ji welikwuo ego ha mgbe ọ bara ọchịchị."
Adinuba kwuru na gọọmenti gwara ndị dọkịta ka ihe ọbụla gbasara ụgwọ ọnwa chere ka e kwuchaa okwu ụgwọ opekatamkpe tupu eleba ya anya.
O kwuru na ndị dọkịta na gọọmentị enweela mkparịtaụka ọtụtụ oge na ọ bụ otu ihe ahụ ka-agwara ha, ka ha nwee ndidi.
O kwuru na dị ka ọ dị ugbua na gọọmetị na-eji ego ruru ijeri naịra anọ akwụ ndị ọrụ ụgwọ, tinyere ụgwọ opekatampe ọhụrụ ga-eru ijeri naịra abụọ na ọma.
N'ajụjụ ego ole gọọmenti Anambra ga-akwụ ụgwọ opekatampe, O kwuru gọọmenti Anambra ga-akwụ ego ole gọọmentị etiti kwuru bụ puku naịra iri atọ.
N'ikpeazụ Adinuba kwuru na ndị dọkịta ga-akwụsị ya bụ abụbụọrụ.












