Anambra Assembly Crisis: Ọ ka na-akpọtụkwa n'ụlọomeiwu Anambara

Ebe foto si, Magnum Photos
Ndị omeiwu Anambara ka na-ama aka maka ndọrọndọrọ onye ga-anọ n'isi oche dịka onyeisi ha.
Ndị na-akwata ya bụ Rita Maduagwu, bụ onye a chuturu n'ọkwa dịka onyeisi ndị omeiwu Anambara, na Ikem Uzoezie, bụ onye ụfọdu ndị omeiwu kwadoro ka ọ nọchie anya Maduagwu.
Cheta na ndị na-akwado Uzoezie kwuru na ha chuturu Maduagwu n'ime izuụka atọ gara aga, mana okwu ahụ nọ zị n'ụlọikpe.
E chere na ọgu nwereike ịda n'etiti otu abụọ n'ụlọomeiwu Anambara Steeti nke mere ndị uweojii ji gbachie ụloomeiwu.
Mana taa, ndị uweojii mepere ya, nke nyere ohere ka otu abụọ a banye ụlọomeiwu.
Ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu Anambara bụ Kingsley Uruba gwara BBC na nsogbu dapụtara mgbe Maduagwu gwara Uzoezie ka o bilie n'oche onyeisi ulọomeiwu.
Uruba sị; "Maduagwu achọghị ikweta na ya abụzighi onyeisi. Ọ chọghị ikwete na a chutuola ya, ọ bu nke a bụ isiokwu."
BBC kpọrọ Maduagwu ịnụta olu ya n'okwu banyere nke a, mana ọ sị na ya nọ n'ime nzukọ.
Amabeghị ebe okwu a na-aga, mana ka ọ dị ugbua, okwu ka dị n'ogwu n'ụlọomeiwu nke Anambara.
Akụkọ pụtara mbụ na soshal midia bụ na nzukọ ndị omeiwu gara n'udo dịka Umeh Jospeh Chinedu dere n'akara Facebook ya:
Onye ọzọ aha ya bụ Okoye Francis tinyere ihe nkiri gosiri ihe mere mgbe ndị omeiwu a zutere na Facebook:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










