Ndị ụlọomeiwu emeela nyocha HIV n'ọha

Ebe foto si, Getty Images
Ihe Karịrị narị atọ n'ụlọomeiwu ndị mba Tanzania emeela nyocha HIV n'ọha iji kpalite mụọ ndị ala ha ime otu a.
Nke a na-eme ka ọ gachara ọnwa isii e jiri malite mgbasa ozi 'nyocha onwe gị ma nweta nleta' nke ebumnobi ha bụ ime ka ndị na-arịa ọrịa mmịnwụ ịnata ọgwụ nleta a kpọrọ 'anti-retroviral drugs (ARVs)' na bekee.
N'okwu ya onye Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Kassim Majaliwa, nyere ndị ndụ okpuru ọchịchị ime obodo iwu ka ha gbaa mbọ wulite obi ndị mmadụ ịga mee nyocha ịma na ha enwere ọrịa mmịnwụ, ka ndị nwere ọrịa nwee ike nweta ọgwụ.
Otu onye omeiwu bụ Oscar Rwegasira Mukasa, ma bụrụkwa onyeisioche kọmitii ndị omeiwu na-ahụ maka HIV gwara BBC na dịka ha mere nyocha n'ihu ọha, na ọ dịrị onye omeiwu ọbụla ikpebi na ọ ga-ekwupụta mpụtara nyocha ahụ gwa ọha.
Ọnụọgụgụ sị n'aka ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ọrịa mmịnwụ na mba ahụ a kpọrọ 'Tanzania Commission for Aids' na bekee, na-egosi na ihe ruru mmadụ nde 1.4 n'ala ahụ na-arịa ọrịa mmịnwụ, ebe ihe karịrị pasenti iri ise ndịa amaghị na ha bu ọrịa ahụ.
Ọrịa mmịnwụ a metụkarịrị ndị ntorobịa dị afọ 14 rue 25.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






