Miyetti Allah South-East: O nweghi ebe anyị na-aga n'ihi na Ndigbo anaghị enye anyị nsogbu

Ebe foto si, AFP
Otu Miyetti Allah bụ otu jịkọrọ ndị ọchịehi ngalaba nke Ọwụwa-Anyanwụ Naijria ekwuola na ha adịghị njikere ịza oku ndị siri ha lọghachi Ugwu.
Ha kwuru na o nweghị onye na-enye ha nsogbu n'Ọwụwa-anyanwụ ga-eme ha hapụ ebe ahụ lọghachiwa Ugwu-Awụsa.
Na mkparịtaụka onyeisi otu Miyetti Allah n'Ọwụwa-Anyanwụ bụ Alhaji Sidikki Gidado na BBC nwere n'ekwentị, o kwuru na ha adịghị nkwadobe ịga ebe ọbụla.
"Anyị agaghị aza oku ahụ n'ihi na anyị na ndị Ọwụwa-Anyanwụ enweghị nsogbu. Anyị bi n'udo."

Ebe foto si, Getty Images
"Ndị ọchịchị steeti dị icheiche hibere otu na-eleba anya na nsogbu ọbụla dapụtara n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo."
Ọ gara n'ihu katọọ oku ahụ ndị okenye Ugwu akpọrọ 'Northern Elders Forum' nakwa ndị 'Coalition of Northern Groups kpọrọ, sị na ha na-awụnyere ha aja na garị.
"Ụdị oku ahụ ga-ebutere anyị nsogbu."
Siddiki dụrụ ọdụ ka ndị Ugwu na nke ndị ndu Ọwụwa-anyanwụ gbakọta ọnụ nwee mkparịtaụka ma e nwe nsogbu kama ị na-akpọ ụdị oku a.
Gee ihe o kwuru n'olu Bekee:
Cheta na abalị ole na ole gara aga, otu jikọrọ ndị okenye na ndị ntorobia ndị Ugwu a kpọrọ ụbọchị Tuzde ka ndị Fulani ọchịehi niile nọ n'Ọdịda Naijiria lọghachi Ugwu Awụsa.














