Atiku vs Buhari: Ben Nwabueze esonyela na ndị ọkaiwu na-ekwuchitere Atiku

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ kachasị mkpa taa (4-7-19)

Ben Nwabueze esonyela na ọkaiwu na-ekwuchitere Atiku

Prof Ben Nwabụeze

Ebe foto si, @Ben Nwabueze Centre

Nkọwa foto, Ben Nwabueze bụ onye ọkakụ ihe gbasara Iwu Naijiria doro anya

Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na mpụta ọkaiwu nwere agba bụ Ọkammụta Ben Nwabueze pụtara n'ụlọikpe maka ikpe Atiku Abubakar na onyeisiala Buhari ga-eme ka okwu ahụ nwe isi.

Ọkaiwu a ma ama bụ ọkammụta Ben Nwabueze esonyere na ndị ọkaiwu na-enọchite Atiku Abubakar n'akwụkwọ ọ gbara Buhari na otu APC n'ụlọikpe maka ntuliaka 2019.

Nwabueze bịara ụlọikpe ya bụ n'okwu ahụ ụbọchị Tọzde dịka e bidoro ya bụ ikpe.

N'ụlọikpe, ndị akwụkwọ Atiku Abubakar na PDP gbara metụtara kpọrọ oku ka a kwụsịtụ ikpe ahụ n'ụlọikpe ntụlịaka.

Ọkaiwu APC na nke Inec kwuru na ha enweteghị akwụkwọ usoro ya bụ ikpe n'oge.

Peter Obi bụ Osote Atiku na ntuliaka 2019, kwuru n'akara Twitter ya na Nwabueze idu ndị ọkaiwu n'ikpe ahụ na agbanyeghị afọ ole ọdị nakwa ọnọdụ ahụike ya bụ ihe agbamụume.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@MistaChika kwuru na ihe o gosiri bụ na ebunauche ndị hụrụ ọchịchị onyekwuoucheya bụ ka oke onye ruo ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@pearltayo kwuru na ọbịbịa Nwabueze na ndị otu ya yiri ndị APC egwu.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@IhoTerence, @EuginhoCortez na @efe_okposio kwuru na mpụta bụ ihe nrịbama n'ihi na ọ bụ akwụkwụ iwu na ga-a ije.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Skip X post, 5

End of X post, 5

Skip X post, 6

End of X post, 6

Mana ụfọdụ katọrọ mpụta Nwabueze n'ihi afọ ole ọ dị nakwa ọnọdụ ahụike ya.

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7

Maka ndị amara ikpeọnwụ atọhapụrụ

Ndị nga

Ebe foto si, Getty Images

A tọhapụla ụmụnne atọ ndị Isiala Ngwa,Abia steeti a mara ikpe ọnwụ maka igbu ọchụ n'ụlọnga ukwu dị n'Enugwu.

Onyeisi kọmiti e hibere maka ilebanye anya n'ọnọdụ ndị nọ na mkpọrọ bụ ọkaikpe Ishaq Bello sị na Azubuije Ehirio na ụmụnne ya bụ ndị nọrọla afọ iri na anọ na mkpọrọ kwesiri ịhapụ ka ha lawa.

Azubuije Ehirio gbara afọ iri asatọ na isii( 86), ebe nwa ya bụ Ehiodo dị afọ iri atọ na atọ (33).

Ndọrọndọrọ "Minority Leader"

Ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, Facebook/Nigerian HoR

Ọgbaghara dara n'Ụlọnnọchiteanya n'Abụja ụbọchị Tọzde maka ụzọ onye ga-abụ 'Minority Leader.'

Akụkọ na- eru anyị ntị na ekwu na onyeisi ya bụ ụlọnnochite anya nta bụ Femi Gbajabiamila wepụtara onye na-abụghị onye pati PDP chọrọ. Ndị otu PDP akatọọla ya bụ agwa.

Blatter akpụpụla Fifa ụlọikpe

Sepp Blatter

Ebe foto si, Reuters

N'egwuregwu, onye bụbu onyeisi Fifa bụ Sepp Blatter akpụpụla Fifa n'ụlọikpe maka ịmetọ aha ya nkwa ijichi elekere aka ya dị iri isii n'ọnụọgụgụ.

A machiri Blatter maka ebubo mpụ kemgbe afọ 2015.

Gee nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Dave Umahi na Ruga

David Umahi

Ebe foto si, Dave Umahi

Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola ihe mere gọọmentị etiti jiri kwụsịtụ atụmatụ Ruga.

Umahi sị na gọọmentị mere nke a n'ihi na atụmatụ ahụ adabachaịghị n'iwu ehibere gbasara ịzụ anụmanụ nke akpọrọ "National Livestock Transformation Plan" (NLTP) na Bekee.

Gọvanọ Umahi bụ onyeisi ngalaba gọọmenti Naịjirịa hibere maka ọgbaghara dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndi ọrụ ugbo gwara ndị ntaakụkọ okwu banyere iha a ka ya na ndị ọzọ ihe a metụtara na Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo mechara nzukọ n'Abụja.

"Anyị bụ ndị ngalaba na-enyocha ọgbghara dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo mere nzuko taa inyocha atụmatụ NLTP gọọmentị hibere,

" Anyi ma na Onyeisiala wezụgara atụmatụ Ruga makana ọdabachịghị n'usoro atụmatụ NLTP ahụ"

Ọkụ na-agba na Ijegun Lagos.

Ọkụ na-agba na Ijegun

Ebe foto si, Akorede J. Ayanbisi

Nkọwa foto, Ọkụ na-agba na Ijegun

Ọkụ na-agba na mpaghara Ijegun dị na Ikotun na Legọs n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Tọzde.

Ndị ọrụ gbata gbata ekwuola na mmadụ abụọ a alala mmụọ n'ihe mberede a ka ndị ekwubeghị ole ha ha dị merụru ahụ.

A na-eche na ọ bụ na-egwu igwe bụ mmanụ agbịdị kpatara ọkụ.

N'Ofesi

Mwakpo ebe ndị mbịarambịa no na Libya

Ebe foto si, Reuters

Ọgbakọ mbaụwa niile bụ United Nations na Bekee etinyela ọnụ na ọnwụ mmadụ iri anọ na anọ nwụrụ n'ogige ndị mbịara mbịara na Libya.

Ha kwuru na ihe a emere pụtara ịkpa arụ n'agha nke bụ "War Crime" na Bekee.

N'egwuregwu

Ụmụnwaanyị ndị otu bọọlụ Netherlands

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị ndị otu bọọlụ Netherlands

Mba Netherlands eruola agba ikpeazụ mbụ ha n'asọmpi ịkọ mbaụwa ụmụnwaanyị.

Ihe ịtụ anya nke a mere mgbe ha ji otu ọkpụ goolu meire Sweden na obere oge etinyere.

Akụkọ ga-amas g

Gee Nkeji a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile