Anambra state: Orụ ndị otu nzuzo akụọla n'aka ndị uweojii

Ndị eboro ebubo isonye n'otu nzuzo

Ebe foto si, NIGERIA POLICE

Ihe ruru ụmụ ntorobia iri na itoolu na-ezuike n'ụlọ mkpọrọ ugbua dịka aka ndị uweojii kparala ha.

N'akwụkọ ozi nke ndị uiweojii ziputere, ọ bụ maka ọrụ otu nzuzo ka eji nwụchị ndị ahụ.

Ọ bụ mgbe ha na-achọ ịkpọbata ndị otu ọhụrụ na otu ha n'ịkpa Ukulu dị na Dunukọfịa ka anwụchiri ha.

Ụfọdụ ihe ndị a natara ha gụnyere ọtụmọkpọ dị icheiche, mma, ịgba na njirimara otu nzuzo Aye.

Ozuolara ndị abalịdịegwu

Ndịuweojii Naịjirịa

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI/AFP

Ndị uweojii na Anambra steeti anwụchiela ụmụnwoke atọ eboro ebubo na ha bụ ndị abali dị egwu na mpaghara Nkpọr n'Anambra steeti.

Ndị ahụ anwụchiri bụ Friday Okpe, Peter Ochai na Chukwuebuka Okafor ma kwuo na ha amalitela nyocha banyere okwu ha.

IPOB a na-aba mba na gịnị mere?

Biafra na Naịjirịa

Ebe foto si, Ebere Ekeopara

Nkọwa foto, 30 Mee 1967 bụ ụbọchị agha Biafra na Naịjirịa bidoro

Otu Ipob apụtala ịkwu na onweghi onye pụrụ ịmegide iwu ha manyere na ndị mmadụ ga-anọ n'ụlọ iji cheta ndị nwụrụ n'agha Biafra.

Ọnụ na-ekwuchitere Emma Powerful kwuru na ọ bụ ihe mwute na ọ nwere ndị kwadoro n'ime onwe ha imebi ya bụ ihe.

Na mba ofesi

Cyril Ramaphosa

Ebe foto si, AFP

Otu meriri na ntuliaka e mere na mba SawỤt Afrịka bụ ANC ekweela ndị mba ahụ nkwa na ha ga-enye ha mbido ọhụrụ.

Cyril Ramaphosa na-efe ọkọlọtọ otu ahụ kwekwara nkwa na ọ ga-akpọbata ndị ntorobia n'ụsoro ọchịchị.

N'egwregwu,

Ohere imeri asọmpị Bundesliga nara Bayern Munich n'iyi dịka ha na otu Red Bull Leipzig gbara onwe ha onye laba onye laba.

Gee Nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile