Ndi agha Boko haram 475 enwerela onwe ha

Ebe foto si, Reuters
Ụlọ ikpe dị na Kainji na Niger steetị ekwuola na ha hapụla mmadụ narị anọ, iri asa na ise, bụ ndị a na-ebo na ha so na ndị agha Boko Haram.
Ụlọ ikpe a kwuru na ha ga-enwogharị ha ka ha bụ ndị nwere emume ọhụrụ n'ala Naijiria.
Onye oka iwu n'ikpe ha kwukwara na ha ewepụla ebubo kwuru na ha bụ ndị agha Boko Haram.
Ndị agha ala Naịjirịa ji ndị a na mkpọrọ dị iche iche n'ugwu hausa, mgbe Boko haram na-ebuso ha agha.

Ebe foto si, Getty Images
Ufọdụ n'ime ha nọrọ na mkpọrọ ka mgbe afọ 2010.
Ụlọikpe kwuru na ha hapụrụ ha makana ndi uweojii enweghị ike iweputa ihe akaebe.
Abubakar Malami bụ oka ikpe ukwu ala Naịjirịa gwara BBC na ndị a ha gbapụtara ga-ahụ ezinaụlọ ha mgbe a hazịchara ha ọfụma.
Ugbu a, otụtụ puku ndị agha Boko Haram na-aza ikpe n'uloikpe dị na Kainji na Niger steeti.









