Boko Haram: Ihe nkiri ọhụrụ egosila etu eji gbuo ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Reuters
Akụkọ ndị oyi egwu Islamic State (IS) zipuru ụbọchi Mọnde bụ ụbọchị 18 nke afọ kwuru na ha wakporo ndị agha Naịjirịa na Borno steeti wee gbuo mmadụ ọkankụ.
Ndị IS na otu n'ime oke abụọ Boko Haram na-aza otu aha.
Otu a ha na IS kwụ bụ nke nwa onye hibere Boko Haram bụ Mohammed Yusuf nọ dịka onyeisi ha.
Abubakar Shekau na-achị oke nke ọzọ.
IS kwuru na ndị agha 40 nwụrụ n'aka ha na mwakpo a.
Ihe nkiri a na-ekegharị na soshal midia na-egosi ihe yiri ndi agha Naịjirịa ka Boko Haram na-awakpo ha.
Ihe a mere n'ọdọ ndị agha akpọrọ Metele di na Borno.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe pụtara n'ihe nkiri a bụ ihe mgbawa obi.
Akụkọ kwuru na onye ndu ọdọ ndị agha a nara mụọ n'ime mwakpo a.
Agbanyeghị na ndị agha Naịjirịa ekwubeghị okwu maka mwakpo a, ndị omeiwu Naịjirịa ekwuola na ha ga nyocha etu o siri mee.
Na soshal midia, ụmụ Naịjirịa tinyere ọnụ na ọdachị a.
Cheta Nwanze, bụ onye ọnụ ya na-eru n'okwu na soshal midia jụrụ ihe mere gọọmentị ejibeghị tinye ọnụ n'ihe mere, kama ha na-ekwu okwu maka ihe ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye nwere akara Twitter @YarKafanchan jụrụ ihe mere ndị ntaakụkọ ekwughi maka ogbugbu a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Omojuwa, bụkwa onye ọnụ ya na-eru n'okwu, dere na gọọmentị etiti dara ya mgbe ọ sị na ha emeriela Boko Haram "technically".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ndị na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru ụnyaahụ na ndị agha ga-ewepụte ozi maka ihe a mere mana onwebeghi ihe a nụru n'ọnụ ha.
Otu Ihe nkiri ụfọdụ ndị agha si ebe ha sị bụ Metele ahụ sete gosiri ebe dị ka ebe ahụ Boko Haram wakporo.
Ndị na-ekwu okwu n'ihe nkiri ahụ kwuru na ha enweghị ihe kwesiri nke mere Boko Haram ji na-awakpo ha n'ike.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
BBC Igbo gbara mbọ ka anụta n'ọnụ Texa Chukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa mana ekwenti ya agaghị.









