Fulani Vigilante Group: Miyetti Allah chọrọ ka e nye ha ọrụ nche Ọwụwa Anyanwụ

Otu Miyetti Allah na-arịọ arịrọ ka e nye ha ohere ịwepụta ndị nche nke ha n'Alaigbo.
Otu Miyetti Allah rịọrọ arịrịọ n'ọgbakọ nchekwa e nwere na steeti Enugu n'ụbọchị Tọọzdee sị ka e nye ha ohere inwe otu ndị nche Fulani ga-eso ahụ maka nchekwa n'Ọwụwa-Anyanwụ.
Otu jịkọrọ ndị Fulani ọchịehi a kpọrọ Miyetti Allah, akpọọla oku ka ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ nye ha ikike inwe ndị ọrụ nche n'Alaigbo iji kwalite nchekwa obodo.

Ebe foto si, AFP
Ọ bụ Odeakwụkwọ otu Miyetti Allah Alhaji Baba Ngelzarma kwuru nke a n'ọgbakọ nchekwa e nwere n' Enugwu ụbọchị Tọọzdee nke otu 'South East Chambers of Commerce, Mines and Agriculture,' (SECCIMA) na otu jịkọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ jikọrọ aka were hiwe.
Ngelzarma onye kwuru na Ndi Igbo bụ ndị na-anabata ndị mbịarambịara, sị na "otu ndị nche ndị ntorobịa Fulani ga-enyere ndị ọrunchekwa, ndị ọrụnche agbataobi aka iji hụ n'obodo deere jii."
Cheta na nsogbu tigbuo-zogbuo dapụtara n'etiti ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụugbo ataala isi ọtụtụ ndị mmadụ ma mebikwa ọtụtụ ihe na steeti dị icheiche n'Ọwụwa-Anyanwụ.






