Deontay Wilder kwuru na ọ na-echebiri Anthony Joshua

Ebe foto si, Getty Images
Nwaafọ mba Amerịka bụ Deontay Wilder na-akọwa na ya dị nkwadobe ka ya na Anthony Joshua pịa ọkpọ.
Wilder kwuru nke a dịka o meriri Luis Ortiz ma nweta ihe nrite WBC ya.
Wilder, dị afọ 32, pịaturu Ortiz, bu nwaafọ Cuba, ugboro abụọ tupu ọ pịa ya nke akpọrọ 'knockout' n'asụsụ Bekee n'agba iri n'ime asompi ha mere na New York.
Joshua bụ onye ji ekike nke IBF na WBA ga-ezute Joseph Parker nke New Zealand na Cardiff nke dị na mba Britian n'ụbọchị 31 nke ọnwa Maachị.
"Achọrọm ịchịkọ ikike a niile. A dị m njikere mgbe ọ bụla ha dị na njikere." Wilder kwuru.
Ọkpọ nke Ortiz pịara Wilder na agba nke asaa bara ya na-ahụ, mana ọ chịkọtara onwe ya, wee nweta mmeri nke 40 ya kamgbe o bidoro pịawa ọkpọ.
"A chọtara m ụzọ m siri laghachite. Onye mmeri ga-achọtarịrị ụzọ. Ihe a ka m mere na abalị a," Wilder kwuru.
Ortiz nwere mmeri n'ọkpọ 28 nke ọ pịarala tupu ya na-ezute Wilder.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










