N30 million bounty: Ndị agha anwụchiela Bobrisky
Akụkọ dị mkpa:
Ndị agha anwụchiela Bobrisky

Ebe foto si, Uche Akolisa
Aka ndị agha NAijria akarala Bobrisky na Rịvas steeti.
Nke a na-eme na erụghị otu abalị Gọvanọ Nyesom Wike bụ aka na-achị Rivas steeti nyechara ntụziaka inye onye ọbụla gbara ama etu aga esi nweta Bobrisky nde naira 30.
Ọ bụ Wike gbara ama na a nwụchiri Bobrisky na nzụkọ ya na ndị ndu obodo Rumuolumeni na obi gọọmentị na Pọtakọt.
Bobrisky Gokana bụ otu onye otu nzuzo na-akpa ike nke a na-eno na aka ya dị n'ogbugbu otu onye ọrụ gọọmenti welitere isi na obodo Choba dị na steeti ahụ.
N'otu aka ahụ, Idris Okuneye nke a ma ama dịka Bobrisky ekwuola n'akara Ịnstagram ya na ọ bụghị ya bụ onye omekome gọvanọ Rịvas na-achọ ka a nwụchie.
" Ekele dịrị Chukwu na abụzị m nwaanyị."
Ahụrụ achụsala ndị omeiwu

Ebe foto si, Shutterstock
Ndọrịtaụka maka ịhe gbasara ọdọ ahịa bụ ihe gbosara n'ike n'ụlọomeiwu mba Kenya dịka isi ahụrụ kpọrụrụ na nsonso.
Otu onye omeiwu bụ Julius Gaya sịrị, "Onyeisi ụlọomeiwu, otu onye n'ime anyị anyụọla ahụrụ isi gbarụọ ikuku. Ama m onye mere ya."
Mana onye ọ tụrụ aka gọrọ isi onwe ya sị, " Ọ bụghịkwa m. Agaghị emeli ụdị ihe n'ebe ndị ogbo m nọ."
Onyeisi ụlọomeiwu bụ Edwin Kakach nyere ntụzịaka ha agbasa ọgbakọ ha nwoke ka ihe na-esi kwụsịlata may nye iwu ka agba ikuku isi ọma n'ụlọomeiwu ahụ.
Kwụọ nde naịra

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe dị na Legọs enyeela onye bụbu onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Maurice iwu ikike iji ego dị otu ijeri naịra na ndị akaebe abụọ gbapụta onwe ya.
Ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ Iwu n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde n'ihi nrụrụaka ego dị otu ijeri naịra na ọma abụọ.
N'akụkọ yiri ibe ya;

Ebe foto si, @atiku/Twitter
Ụlọọrụ EFCC ekwuola na ha adịla njikere ịkpụpụ ọkaiwu Atiku Abubakar na nwanne ya nwoke n'ụlọikpe mpupu ego dị nde dọla abụọ.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Tony Orilade gwara BBC Igbo na ndị a ga-awụchi n'ụlọikpe na-egbughi bịa zara ọnụ.
Onyeisiala Buahri alala Daura

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Buhari alala n'obodo ya bụ Daura, Katsina Steeti maka emume Salah ga-amalite ụbọchị ụka ebe nwunye ya bụ Aisha gawara Mina, Saudi Arabia ime nke ya.
Buhari na-anọ n'obodo ya rue abalị iri na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Akụnaụba mba UK adaala mba nke mbụ ya kamgbe afọ 2012 dịka ụlọọrụ ngụkọ a kpọrọ National Statistics si kwuo.

Ebe foto si, Enugu State Government
Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi enyela iwu ka ndị eze ọdinala niile na ebighị na obodo ha n'Enugwu steeti were ọsọ laghachị azụ ga biri na obodo ha.
Gọvanọ Ugwuanyi kwuru nke a dịka ya na ndị eze nwere nzụko n'ụbochị Tụzde.
Ugwuanyị kwuru na nchekwa ndụ na akụnụba ndị Enugwu steeti kacha mkpa nke mere na ndị eze ọdịnala kwesịri ibi n'obodo ha na-achi ka ha nyere aka na nchekwa obodo ha.
Ọnwụ Mazị Chimaobi Uzoukwa: "Anyị ga achụ ikpe a churuo ya n'isi" Gọvanọ Ikpeazu

Ebe foto si, @okezieikpeazu
Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti ekwuola na anwụchịela onye agha gbagburu nwaokoroọbia n'Aba.
Obị adighị Ikpeazu nma dịka o kwuru na ndị nchekwa a na akwu ugwọ maka nchekwa ndi obodo bụzi ndi na-egbu ndi obodo ha na-echekwa.
Ikpeazu kwuru nke a mgbe ọ gara mgbaru na be nwaamadị a nwụrụ sị na ndị Abia steeti anabataghị ụdiri agwa ọjuọ a ma kwee nkwa na ezinaụlọ ya agaghị ata ahụhụ.
Na Kogi,
Otu ndọrọndorọ ochịchị agbaala osote Gọvanọ bụ Simon Achuba arụkwaghịm.
Ha kwụrụ na ha chụpụru ya nihi na okpara agwa megidere ọdịnma APC mgbe a na eme ntuliaka 2019.
N'Ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka nnabata ndị mmadụ n'ọbodo Amerịka ekwuola na ha ahapula mmadụ nari atọ n'ime ihe ruru ndị mmadụ Nari isii na iri asatọ ha nwuchiri n'obodo Missisipi .
Nwụchịkọ ndị a sọ na atụmatụ Onyeisiala Donald Trump weputara n'onwa Jụn maka ịnwụchị ndị na-ejighi akwukwo ziri ezi bata Amerika.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Obi adighi ndị na akwado otu egwu bọolụ Arsenal mma dịka ha resiri Everton Alex Iwobi n'ọnụ ego ga eru Pounds iri atọ na anọ.
Cheta na Iwobi bidoro gbawa Arsena bọolụ n'afọ 2015 ma ugbua, ọ ga a nonyere Theo walcot sikwa Arsenal gaa Everton.
Gee nkeji BBC ebe:










