Enugu-Onitsha expressway: Okporoụzọ akpọchiela kpam kpam n'Amansea

Okpoụzọ Amansea- Oji River
Nkọwa foto, Ụfọdụ na-ekwu na ụzọ kpọchiri kemgbe abalị Fraide.

Ndị njem si Awka aga Enugwu nakwa ndị si Enugwu aga Awka atọkịrịla na Amansea kemgbe elekere ise gara aga.

Ihe kpatara nke a bụ ajọ okporo ụzọ awara awara bụ Enugwu-Onitcha express nke kpatara na ụgbọ ala niile tinyere isi na ya bụ ụzọ ochie.

Aha onyonyo, Okporoụzọ ala Igbo

Onye nta akụkọ BBC na-agafe ya bụ ụzọ kwuru na ndị njem nọ na ịta nkịkịrị eze ugbua.

Okpoụzọ Amansea- Oji River

Ọ bụghị taa ka okwu ụzọ ahụ nakwa nke Enugwu-Ọnịcha bidoro ịfịọ na mpaghara ahụ.

Ọtụtụ mmadụ akpọkuola gọọmentị maka ya bụ okporoụzọ Enugwu Ọnịcha.

Gọọmentị na-ekwu na ha ebidola ọrụ n'okporoụzọ ahụ mana mgbe BBC Igbo gara ya, sọsọ otu akụkụ ka ha rụrụ.

Ụzọ oji- amansea

Akụkọ ga-amasị gị