Ibrahim EL-Zakzaky: Ndị otu IMN ebola gọọmentị Kaduna ebubo igbu ya

Ebe foto si, El-Rufai/ Facebook
Ndị otu Islamic Movement of Nigeria (IMN) ekwuola sị na gọọmentị Kaduna steeti wepụtara atụmatụ a iji gbuo onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky.
Ha kwuru nke a ka aka na-achị steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai wepụtara akwụkwọ iji kwuo ihe ha chọrọ tupu El-Zakzaky enwee ike gaa India nata ọgwụgwọ.
Ha boro gọọmentị ahụ ebubo iwepụta atụmatụ a naanị iji emegide ma gbuo El-Zakzaky ka ọ nọ na nwụchi. Ha kwuru na ha anabataghị ya bụ ọnọdụ.
Gọọmentị Kaduna steeti kwuru na ha chọrọ ka e lebanye anya tupu El-Zakzaky agaa India ịnata ọgwụgwọ dịka ụlọikpe nyere ya ikike.
Dịka a gbara El-Zakzaky akwụkwọ n'ụlọikpe dị na Kaduna steeti, gọomentị obodo ha sị na ha achọghị akụkọ na e jikwa gbagbuo nwa nnụnụ nne ya efelie mgbe ọ ga-aga ụlọọgwụ.
Ha kwuru na ha anọchighikwa onye ọbụla ụzọ ịnata ọgwụgwọ ahụike na mba ọbụla dị n'ụwa a ebe ọ bụ na onye ahụ na-akwụ ụgwọ ya.
Ugo Egbujo bụ ọkaiwu ọnụ na-eru n'okwu gwara BBC Igbo sị na ndị gọọmentị Kaduna steeti " kwesịrị ịkọwa etu ha chọrọ iji elebanye anya n'ọpụpụ na mbata ha makana ụlọikpe nyere ha ikike ahụ".
"Ha eleela anya sị lekwa etu a ga-esi eme ya 'a ga-eme ya etu a mee ya etu a'. Etu a ha si depụta ya, onye na-ekwuchitere ndị otu El-Zakzaky bụ IMN ga-ele akwụkwọ ahụ anya.
"Ọ bụrụ na o chee na ndị Kaduna steeti na-emegide ha, o were ya gaa n'ụlọikpe ahụ, ebe ha ga-anọ ekwu ma ọnọdụ niile ahụ ndị Kaduna wepụtara eziri ezi maọbụ na o zighi."

Ebe foto si, Nasir El-Rufai/ Facebook
El-Zakzaky na nwunye ya bụ Zeenah Ibrahim kwesịrị ịga n'ụlọọgwụ Medanta dị na mba India, ebe ụfọdụ ndị gọomentị ga-eduga ha ịhụ na ha erighi mbombo ọsọ.
N'okwu El-Rufai tinyere na Facebook, Samuel Aruwan bụ kọmishọna na-ahụ maka nchekwa obodo na steeti ahụ kwuru ebumnuche ha.

Ihe asaa gọomentị Kaduna steeti chọrọ tupu El-Zakzaky agawa njem ya:
- Ha chọrọ ka mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba tinye anya ịhụ na El-Zakzaky na nwunye ya yiri agba n'ụlọọgwụ Medanta, ma hụkwa na ha mezuru iwu niile ụlọikpe kwuru maka njem ọgwụgwọ ha.
- El-Zakzaky na nwunye ya ga-aṅụ iyi ịlọghachite Naịjiria maka ikpe ha ozugbo ndị ụlọọgwụ na-ahapụ ha ka ha gawa. Ha ga-ejikwa aka ha kwụọ ụgwọ ihe niile gbasara njem a gụnyere ma njem ha, ọgwụgwọ, ụgwọ ụlọ ebe ha na ndị otu ha ga-anọ.
- El-Zakzaky na nwunye ya ga-achọta ndị isi a hụrụ kwaba okpu abụọ ga-abụrụ ha ndị akaebe; otu ga-abụrịrị onye eze a ma ama ebe nke ọzọ ga-abụ onye a ma ama na Kaduna steeti. Ha ga-aṅụ iyi ịkpọpụta di na nwunye a mgbe ọbụla ụlọikpe chọrọ ha. Ndị akaebe a ga-egosipụtakwa na ha nwere ala maọbụ ụlọ na Kaduna steeti.
- Gọọmentị mba India ga-aṅụ iyi nye gọọmentị etiti Naịjirịa na ha agaghị anabata mkpesa ọbụla di na nwunye a maọbụ onye otu ha ga-ekpesa maka ịnọ na mba ha dịka onye gbara ọsọ ndụ.
- Di na nwunye a ga-aṅụ iyi e deturu n'akwụkwọ nke ọkaiwu ha ga-ekwenye, na ha agaghị eme ihe ọbụla iji megide ikpe a na-ekpe ha, udo na nchekwa Naịjirịa nakwa iwu obodo India n'ụzọ ọbụla.
- Ndị ọrụ nchekwa gọomentị etiti Naịjirịa ga-edugarịrị di na nwunye a ma nọrọ ebe ahụ ruo mgbe ha natachara ọgwụgwọ, ma sorokwa ha lọghachite Naịjirịa.
- Ụlọọrụ nnọchiteanya Naịjirịa dị n'India ga-eleru anya ala ma kwenye tupu onye ọbụla abịa njem nleta ebe di na nwunye a nọ n'India.
Ha gakwara n'ihu kọwaa ihe butere nwụchi a nwụchiri El-Zakzaky na nwunye ya n'afọ 2015.
Gụọ ihe o dere ebe a:
Cheta na ụlọikpe nyere iwu sị ka a hapụ El-Zakzaky ka ọ nata ọgwụgwọ n'India n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:












