Aba Killing: Ihe ndị uweojii na-ekwu maka nwaamadị egburu n'Aba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa:

Agbagbuola otu nwaokorobia n'Aba

Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha

Ebe foto si, AFP

Ọnụ na-ekwuchitere ndị Uweojii nke Abia Steeti bụ Geoffery Ogbonna gwara BBC na n'ezie na a gbagbụrụ otu nwaokorobia n' Umuokereke, Obingwa, Aba.

O kwukwara na ndị uweojii gbalịrị ikwusị ndị okorobia bụ ozu onye agbagbụrụ ime ngagharịiwe tupu ọ banye ọgbaaghara.

Ogbonna gwakwara BBC na Eze Ododo ahụ edele akwụkwọ degara ndị uweojii maka ihe mere.

Ọ na- akowa na ndị uweojii na-agba mbọ ịchọputa onye gbagburu nwoke ahu.

N'aka nke ọzọ, akụkọ na-agagharị na soshal midịa na-ebo ebubo sị na ọ bụ onyegha gbagbụrụ nwoke ahụ maka ịjụ inye ngagharị.

Ndị agha egbuola ndị uweojii atọ

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Frank Mba sị na ndị uweojii atọ lara mmụọ mgbe ndị agha Naịjirịa ji egbe wakpoo ha ma tọghapụ onye ntọ ha kpụ aga n'okporoụzọ Ibi-Jalingo dị na Taraba Steeti.

Mba kwuru na ndịagha a gbagburu ndị uweojii ahụ na-agbanyeghị na ha huputara na ha bụ ndị uweojii.

O kwukwara sị "Ndiagha a tụghapụrụ onye ejieji maka ntọrị bụ Alhaji Hamisu, onye nọ n'ọsọ ugbua"

Col Sagir Musa bụ ọnụ na-ekwuru ndịagha kwuru na ndịagha ahụ gbagburu ndị uweojii ahụ amaghị ama dịka ha nwetere ozi na ndị ntọ kpụ ndị mmadụ na-agafe.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ka na eme nyocha maka ihe a mere.

Lee akwụkwọ ndị uweojii deputara si na ndịagha gburu ndị uweojii atọ ma tụghapụ onye ntọ ama ama ha jidere.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Maurice Iwu amala n'ọnya ndị EFCC

Maurice Iwu

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe ukwu dị na Legọs enyela ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), ikike ijichi onye bụbụ onyeisi Inec bụ Maurice Iwu rue ụbọchị Fraide oge a ga-ekpe ikpe ma a ga-atọhapụ ya.

EFCC kpụpụrụ Iwu ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka ego ruru otu ijere naira na ụma(N1.2billion.)

Iwu rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec bido n'afọ 2003 rue afọ 2010 n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo.

E boro Iwu ọtụtụ ebubo akwụbaghị aka ọtọ n'ihazi ntuliaka 2007 e mere oge ọ nọ n'ọkwa.

Gọọmentị Kaduna ekwuola ihe ha chọrọ tupu ha ahapụ el-Zakzaky

Sheikh Ibrahim Zakzaky

Ebe foto si, IMN

Nkọwa foto, Sheikh Ibrahim Zakzaky

Gọọmentị Kaduna ewepụtala usoro ha sị ha ga-eji kwenye n'ikike ụlọikpe nyere ka Ibrahim el-Zakzaky na nwunye ya gaa nata ọgwụgwọ n'India.

N'akụkọ gọvanọ steeti ahụ bụ Nasir el-Rufai tinyere na soshal midia, steeti ahụ si ka a kawa ahụ hụ na EL-Zakzaky ejighi ohere a gbaa ọsọ ndụ na mba ọzọ.

Senatọ Ukazi na ICPC

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ngalaba na-ahụ maka mpụ bụ Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) amanyela Omeiwu Chukwuka Utazi ike ngwaọrụ o kwesịrị ike ndị Enugwu Nọt dika ihe Bekee kpọrọ "Constintuency Project".

Ngwaọrụ ndị a dị n'ụlọ Ukazi gafee otu afọ gunyere ọgbatumtum 228, keke napep 51, igwe e ji akwọ ihe 203 na transformer ise.

N'Egwuregwu

Ed Woodward
Nkọwa foto, Ed Woodward

Nke na-ewu na soshal midia ugbua bụ #WoodwardOut.

Ed Woodward bụ osote onyeisi oche otu Manchester United nke ndị nkwado otu bọọlụ ahụ chọrọ ka a chụọ ya n'ọrụ.

Iwe ha bụ na kamgbe Woodward malitere ọrụ dịka osote onyeiusioche, Man Utd ebutebeghi iko ọbụla.

Obi adịghịkwa ndị nkwado Man Utd mma maka na onweghi onye ndị otu ha gotere ga-anọchị anya Romelu Lukaku bụ onye nke hapụrụ ha gawa Inter Milan.

Lee ihe ụfọdụ na-ekwu:

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Skip X post, 5

End of X post, 5

Man City azụrụla Cancelo

Joao Cancelo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Joao Cancelo abatala Manchester City

Ndị otu egwu bọọlụ Manchester City ejirila ego gbara ọkpụrụkpụ n'ụda nde paụnd 60 were zụpụta Joao Cancelo n'aka ndị Juventus.

Dịka Cancelo na-abata Manchester City, ka Danilo Luiz da Silva na-agba n'azụ si Manchester City agafe Juventus n'ọnụ nde paụnd 34.

Lee Akụkọ Ga-Amasị gị

Lee Ihe Nkịrị Ga-Amasị Gị

Aha onyonyo, Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ