Tekno Arrested: Ndị Uweojii anwụchighị Tekno, ọ biara zaa ajụjụ

Ebe foto si, Getty Images
N'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ka ndị mmadụ hụrụ ụgbọala bu Tekno onye ezigbo aha ya bụ Augustine Kelechi na ụmụnwaanyị na-eyichighi ahụ na-agba egwu n'okporoụzọ Lekki dị na Legọs steeti.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Legọs Steeti bụ Bala Elkana ekwuola na ha anwụchighi Tekno, kama ha kpọrọ ya n'ụbọchị Tuzdei ka ọ bịa zara ajujụ maka ihe mere.
Ọ kwukwara na ha kpọrọ onye na-elekọta Tekno ma kwa ndị niile aka ha dị na ya nke tinyere ụmụabọghọ ahụ yi mbenukwu, ka ha bia zara isi ha.
Elkana kwukwara na ndị uweojii ka n'eme nyocha.
Tekno na onwe ya apụtabuola n'igwe Instagram rịọ mgbaghara ma kwuo na ọ bụghị mgbasaozi maka ebe ụmụnwaanyị na-agba ọtọ agba oringo ka ha na-eme.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
A chụpụrụ nwaanyị onye omeiwu maka iku nwa ya dị ọnwa ise bịa ụlọomeiwu

Ebe foto si, Twitter/@ntvkenya
A chụpụla nwaanyị onye omeiwu mba Kenya bụ Zulekha Hassan n'ụlọomeiwu mba ahụ maka iku nwa ya dị ọnwa ise bịa ọrụ.
Hassan kwuru na o nwere ihe dapụtara nike ụlọ ya mana Christopher Omulele, bụ onyeisi ụlọomeiwu mba ahụ onye nyere ntuzuaiaka ahụ kwuru na ụlọomeiwu abụghị ebe a na-elekọta ụmụaka.
Okorocha asaala Ihedioha n'ọdịda akpụrụakpụ ya

Ebe foto si, Facebook/Emeka Ihedioha/Rochas Okorocha
Aka chiburu Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na gọvanọ nọ ugbua bụ Emeka Ihedioha na-eji abali akụtusi ihe ọ rụrụ ma kwuo na ha dara n'onwe ha.
N'ozi si n'aka onye ndụmọdụ bụ Sam Onwuemedo pụta, Rochas sị Ihedioha na-ebuso ya agha n'ihi mmeri o meriri PDP n'afọ ndị gara aga.
Ụlọikpe akagbuola iwu Sịnetị nyere Edo Steeti

Ebe foto si, @NGRSenate
Ulọikpe dị n'Abuja nọrọ ụbọchị Wenezde nyee Ụlọomeiwu Naijiria iwu ka ha sepụ aka n'okwu gbasara iweghara ụlọomeiwu Edo steeti.
Cheta na gọọmenti Edo steeti gbara akwụkwọ n'ụlọikpe iji gbagha iwu ụlọomeiwu etiti nyere ya ka o kposala ụlọomeiwu steeti ha hiwere.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Nwafọ mba Yuregua a ma ama n'ịgba bọọlụ bụ Diego Forlan awụsala ọwa dịka ọgbachara bọọlụ afọ iri abụọ na otu.
Forlan gbara bọọlụ n'otu egwuregwu ndị dịka Manchester United, Atletico Madrid, Inter Milan na ndị ọzọ.
Nkeji
Lee ihe nkịrị ga-amasị gị -
Mwakpo nwantakịrị n'Imo steeti

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Ikeokwu Godson Orlando ekwuola na aka akparala otu nwoke dinara nwatakịrị nwaanyị n'ike.
O kwuru na ọ bụ ngalaba uweojii nke SARS Imo steeti nwụchiri otu nwoke aha ya bụ Onyekwere Umunna gbara afọ iri isii maka idina nwatakịrị a dị naanị afọ asaa n'ike.
Umunna ekwenyela na ebubo eboro ya bụ eziokwu.
Otiinwata echerela ndị mba Zimbabwe aka mgba

Ebe foto si, Getty Images
Agụụ na-akwado ịgụgbu ihe karịrị mmadụ nde ise na mba Zimbabwe dịka oke ọkọchị nke ụkọ mmiri ozuzo na-ebute, ajọ ifufe na nsogbu enweghi nnukwu akụnaụba, na-asụ Zimbabwe akwụ.
Ndị World food program na ngalaba United Nations na-agba mbọ ịnakọta ego ga-eru nde Dọla narị atọ na ọma nke a ga-eji gbatara ha ọsọ enyemaka.
N'Ofesi

Ọ bụ na mba Mexico ka ndị ojiegbe ezu abụọ maburu egoigwe ọlaedo nke ruru nde dọla abụọ were gbalaga.
Ndị uweojii na-enyo ndị ọrụ nke ụlọakụ Casa de Moneda ebe e zuru ohi a n'ihi na ha na-akọwa na o nwereike ịbụ oke nọ n'ụlọ gwara oke nọ n'ohia na azụ dị n'ofe.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Liverpool ebinyela otu egwu bọọlụ FSV Mainz nke spain nwaafọ Naịjirịa bụ Taiwo Awoniyi.
Awoniyi dị afọ iri abụo na otu anọọla na Liverpool kemgbe afọ 2015, kama o sobeghi ha gbaa bọolụ.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a:











