Bank robbery: Ndị ojiegbeezu awakpoola ụlọakụ n'ehihie na abọ mụ anya

Ebe foto si, Getty Images
Ndi uweojii Ondo steeti ekwuola na ha kụrụ ndị ojiegbeezu wakporo otu ụlọakụ dị n'Iju n' okpuru ọchịchị Akure-North n'Ondo steeti n'ehihie Tuzde njọ ahịa dịka o nweghị ihe ha zutere.
Mana ndị omekome ahụ gburu otu onye ọrụ ụlọakụ ahụ, ebe ụfọdụ ndị mmadụ merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara ka ndị ekperima ahụ wụchiri ụlọakụ ahụ wụwa mgbọ n'ehihie na abọ mụ anya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Femi Joseph gwara BBC Igbo na "o nweghị ihe ha zutere."
O kwuru na ndị ọrụ ha nwetara ozi na ndị omekome zọchiri n'ụlọakụ ahụ, ma zaa oku a kpọrọ ha ngwangwa.
Joseph, onye gbara ama na mkpọ tụrụ otu onye n'ime ndị omekome ahụ oge ha na ndị uweojii na-akwarịta mgbọ kwuru na ndị ekpereima ahụ ghaara ụgbọala abụọ ha jiri bịa ije ọjọọ ahụ, gbalaga.
Ọ gara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-esi imi n'ala inweta ndị nyụrụ ihe na-esi ebe ahụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:







