Etu Mmadụ 12 siri laa mmụọ n'aka ndị oji egbe ezu gara ụlọakụ

Ndị uweojii naijria

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị uweojii anọ nwụrụ na mwakpo a

Ihe ruru mmadụ iri na abụọ gụnyere onye uweojii nwụrụ na mgbede ụnyaahụ oge ndị oji egbe ezu wakporo ụlọakụ dị n'Igarra n'okpuru ọchịchị Akoko-Edo ma chọọ izu ụfọdụ ụlọakụ ebe ahụ ohi.

Ụfọdụ ndị uweojii nwuchiri n'ụtụtụ ụnyaahụ so na ndị e gbagburu na mkpa mkpa ahụ.

Akụkọ kwuru na ndị oji egbe ezu ahụ buru ụzọ wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii nọ na nso ụlọakụ ndị ahụ iji kwụsị mmekpa ọbụla ndị uweojii nwereike inye ha.

Dịka ha na-eme ihe ahụ, ha gbara ụgbọala onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ ọkụ ebe ha gburu mmadụ atọ ndị ọzọ nọ n'akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii ahụ.

Ha gbukwara ihe ruru mmadụ anọ ọzọ n'ime ụlọakụ ahụ ebe ha na-ewe iwe na ha enweghi ike imepe igbe ego ndị ụlọakụ ahụ.

Otu onye hụrụ ihe mere kwuru na ndị uweojii nọ n'ụlọakụ ahụ gbalịrị ịkwụsị ndị oji egbe ezuu ahụ mana ha karịrị ha ike nke butere ọnwụ otu onye a na-amaghị onye ọ bụ.

O kwuru na onye ọzọ nwetakwara onwe n'ime agha egbe ahụ bụ onye nwereike inyere ndị uweojii aka na nyocha ha.

Onye kwadoro akụkọ a bụ onye nkwuchiteọnụ ụlọ Eze Otaru nke Igarra bụ Folorunsho Dania kwuru na mmadụ 10 bụ ndị nwụrụ n'ihe niile ma kwuo na ọ bụ ihe siri ike.

BBC Igbo gbara mbọ inweta onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii bụ Chidi Nwabuzor mana ọ zaghị.

Ụdị mkpamkpa a dị ka nke mere na Kwara steeti n'ọnwa Epureel 2018.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ