Ndị ohi ejirila aka ha kpọga onwe ha mkpọrọ na Saụt Afrịka

Onye a tụrụ ịga

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye a tụrụ ịga
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụmụnwoke anọ a na-ebo ebubo izu ụgbọala ji aka ha nyara ụgbọala ahụ nyaba n'ụlọ mkpọrọ na mba Saụt Afrịka.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Cape Town bụ Wayne Dyason, kwuru na ndị uweojii nọ na-achụ ndị ohi ahụ ọsọ, nke mere ka ha nyaba n'ime ụlọ mkpọrọ Pollsmoor; bụ ebe akpọchiburu Nelson Mandela onye na-ekwugide ịkpa oke agbụrụ.

Ndị ntaakụkọ News24 sị na Dyason kwuru na "ha gbapụtara n'ụgbọala ahụ ma gbabanye n'ime ụlọ mkpọrọ ahụ ebe anwụchiri ha."

Dyason kwuru na ha abụghị nwata n'ịkpa mkpamkpa.

O kwuru na ha bụ ndị ekperima e kwesịrị ịtụ ezigbo egwu maka na ndị uweojii nyochara ha wee hụ na ha nwere okwu ha kwesịrị ịza maka ogbugbu mmadụ ruru ụzọ iri atọ na ise (35), ịnwa igbu mmadụ, izu ohi nakwa ijide ngwaagha na-ekwesịghị ekwesị.

Ndị News 24 tinyere ụgbọala ha zuru na Facebook:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ