Falz akatọọla NBC maka ịmachi egwu #ThisisNigeria

Ebe foto si, Falz/Youtube
Ngalaba gọọmenti na-ahazi mgbasaozi n'ikuku nke a kpọrọ 'National Broadcasting Commission (NBC)', agọọla na ha amachighị egwu otiegwu Folarin Falana ama dịka Falz a kpọrọ #ThisisNigeria na egwu ndị otiegwu ndị ọzọ.
Falz katọrọ NBC n'igwe okwu Instagram ya maka idegara ụlọọrụ mgbasa ozi n'ikuku akwụkwọ sị ha kwụsị ịkpọ egwu #ThisisNigeria (Falz), Iskaba(Wande Coal nakwa See Mary, See Jesus(Olamide) n'ihi na ha nwere "okwu na-asọ oyi na ntị" nakwa ịda otu ụlọọrụ redio dị na Jọs, nha narị puku naira maka ịkpọ egwu ndị a.

N'ịkwa emu, Falz kwuru na "Nke a bụ Naijiria ebe onye ọbụla bụzị onye omekome bụ okwu na-asọ oyi na ntị."
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Mana n'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuchitere NBC bụ Maimuna Jimada gọrọ na NBC amachighị egwu #ThisisNigeria dịka e si bo na ebubo.
O kwuru na NBC "enweghị ikike ịmachi egwu ọbụla mana anyị nwere ike ịdọ ndị ọrụ mgbasa ozi aka na ntị banyere ihe na-asọ ntị oyi dị n'egwu ụfọdụ."
Ọ gara n'ihu kwuo na ihe ha kwesịrị ime bụ ịga hichapụ akụkụ egwu ndị ahụ adịghị mma na ntị "mana nke abụghị na ndị mmadụ enweghị ike ịga zụrụ egwụ ndị ahụ ebe o zuru oke kpọọ n'ụlọ ha."
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmachi ahụ
Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akatọ ụkwụ ahụ NBC zọpụrụ.
@Shawnife kwuru na ala anyị a kpọrọ ndị na-ekwu eziokwu asị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@Osacruz kwuru na ha hapụrụ ịmachi egwu na ihe nkiri na-akwado ajọ ihe, machie nke na-ekwu maka nsogbu ndị ala Naijiria na-arịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Iam_Abdulaxis jụrụ na dịka a machiri egwu Falz, Naijria ọ ga-aghọkwa nnukwu mba ọzọ?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Akụkọ ga-amasị gị:









