Fr. Mbaka: O nweghị ụmị mmanụ maọbụ ego Buhari bunyere m na 2015

Ebe foto si, MBuhari Twitter
N'ịsa ebubo ndị mmadụ na-ebọ ya na o nwere ihe e nyere ya iji kwado Buhari na 2015, Mbaka kwuputara n'oge ọ na-eme ọgbakọ 'Adoration' ụnyaahụ bụ Wenezde nke a na-akpọ"I no dey again", na Buhari enyeghị ya "oil well" maọbụ "ego ọbụla".
Cheta na tupu ntuliaka 2015, Mbaka buru amụma na Buhari ga-emeri na ntuliaka ahụ, nke mere na ụfọdụ na-atụ ya aka sị na o so dọnyere Buhari ukwu, dịka o mechara gaa zute Buhari n'Asọ Rock'.
Ọ gwara ndị mmadụ ka ha hapụ ya aka n'ihi na amụma ọbụla si ya n'ọnụ pụta bụ ihe mmụọ nsọ gwara ya kwuo.
Mbaka kwuru na agbanyeghị akụkọ ọbụla ma ọ bụ akaja ọbụla ọ sọrọ ndị mmadụ mee ya, na ọ ga na-ekwu eziokwu oge niile.
Ọ gwara ụmụ Naijịrịa ka ha banye n'ekpere iji wepụ aka ekwensu n'obodo Naijiria.

Ebe foto si, Adoration ministries
Mbaka chetaara ndị mmadụ na dịka onye ụkọchukwu, na e chiri ya ihe atọ; "onye ụkọchukwu", "onye Eze" nakwa "onye amụma."
Fr .Mbaka jikwa ohere ahụ were ekpere wee rịọ Chukwu ka ọ gbanwee ọnọdụ ndị egwuregwu bọọlụ Rangers ndị bịara ụka ịtụ mmamma n'ogige Adoration, Enugwu.
O kwara arịrị na Rangers Enugwu gakatara ihu gawa azụ, ma rịọọ Chukwu ka ha bido inwekwa mmeri ọzọ.










