Oriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ.

Aha onyonyo, Oriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ.

Ịgwa Nshị bụ omenala ndị obodo Eke n'Enugwu steeti na-eme otu ugboro n'afọ iji were cheta mmeri ndị nna nna ha meriri ndị agbata obi ha na-agha.

Ihe e ji eme ya bụ mmemme Igwa Nshị bụ ịkụ nnukwu Igba nke a na-akpọ Abia Nshị.

Onye Eze na-achị obodo Eke bụ Igwe Harry Onuoha kọwara na oge ochie, ndi Eke na eji ọgwụ na iku egwu were na emenye ndị agbata obi ha dịka Ebe, Abor na Ngwo egwu.

Nrị e ji eme ya bụ Igwa Nshị bụ nanị Ọkpa. Ndị Eke na-esi ya bụ ọkpa n'ụdị pụrụiche, ha sichaa ya, ọ na acha ọcha.

Ha ewerezịa akwụkwọ nrị na ngwa ndị ọzọ gwọọ ya.

Ụzọ ọkpa atọ ndị Eke na-esi bụ "Ikpo Nkiịtị", "ite na-esi onwe ya" na "Emeghi eme"

Igwa Nshị ndị Eke na-ewe ụbọchi atọ: ụbọchị ịkụ abịa, ụmụnwoke na ụmụnwanyị na-ezukọ n'ọgbọ ịkụ Igba site n'ụtụtụ rule n'abalị.

Otụtụ ndị Eke dika Felix Mgbo kwuru na ịgwa nshị abụghịzị ihe igwọ ogwụ dika ndị mgbe ochie, kama na e jizi ya ekpokọ ndị Eke niile ọnu.

Lee ka mmemme Igwa Nshị nke afọ a siri mee n'Eke.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: