Cyclone Idai: Lee etu ajọ ifufe mmiri siri mee ndị obodo a ịwa

Aha onyonyo, Cyclone Idai: Lee etu ajọ ifufe mmiri siri mme ndị obodo a ịwa

Okeifufe mebiri ọtụtụ ihe

Ihe ndị Cyclone Idai mebiri

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nwoke na-achọ nwa ya n'ime ihe ndị mebiri emebi.

Onyeisiala mba Mozambik bụ Filipe Nyusi, kwuru na mmadụ ruru otu puku anwụọla n'oke ajọ ifufe mmiri dakwasịrị obodo ahụ.

O kwukwara na mgbe ọ gara nyochaa, o ji anya ya hụ ozu ndị sere n'elu n'ime mmiri ahụ.

Ajọ ifufe mmiri ahụ nke bekee kpọrọ 'Cyclone Idai' malitere ịkpa ike kemgbe ụbọchị tọzde izu gara aga bụ Maachị 14.

Mana ọ bụ n'ụbọchị ụka ka enyemaka ruru ndị mmadụ aka.

'Cyclone Idai' metụtakwara mba agbatobi Mozambik gụnyere Zimbabwe nakwa Malawi.

Lee ihe ndị o metụtara

Praise Chipore, 31, na-anata ọgwụgwọ n'ụlọgwụ na Zimbabwe March 18 2019

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Praise Chipore, 31, na-anata ọgwụgwọ n'ụlọgwụ na Zimbabwe

Gọọmentị Zimbabwe kwuru na mmadụ karịrị narị abụọ nwụrụ n'ọdachi a.

Ihe ndị Cyclone Idai mebiri

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-achọ ndị dị ndụ na mpaghara ọwụwa-anywanwụ Zimbabwe

Otu onye ọrụ UN bụ Gerald Bourke kwuru na gbamgbam ọtụtụ ụlọ dara ada nke mere na ndị mmadụ enweghizi ebe obibi.

Foto na-egosi obodo ebe ihe ahụ mere

Ebe foto si, IFRC/Caroline Haga

Ihe ndị mebiri na Mozambik

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Cyclone Idai mebiri ọtụtụ ụlọ na mba Mozambique

Ọtụtụ ihe dịka ụzọ nakwa ụgbọala mebiri n'ihe ọdachi ahụ mere.

Ndị nwụrụ n'ihe ọdachi a gụnyere ụmụakwụkwọ abụọ mgbe okwute si n'elu ugwu dakwasịrị ụlọ obibi ha n'ime ụlọakwụkwọ.

Ụzọ mere nkebi maka ịbịbịa mmiri a
Ụgbọala mebiri mgbe osisi dakwasịrị ya

Ebe foto si, AFP

Foto nakwa eserese ndị ọzọ si ebe ahụ apụta na-egosi ndị ka rigoro n'elu ụlọ ha na-eche enyemaka.

Ụlọ dara mmiri

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị rịgoro elu ụlọ na Beira dị na Mozambique ịchọ enyemaka

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị