Etu ndị ide mmiri metutara ga-esi nweta nkwado - Buhari

Ide mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Ka nnukwu mmiri na-ezo na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, oke ide mmiri na-achụpụ ndị mmadụ n'ụlọ ha ebe onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru na a ga-enya ndị ọdachị a metụtara enyemaka etu o si kwesi.

Onyeisiala Buhari kwuru nke a ụnyaahụ mgbe ọ na-etinye ọnụ n'ihe mgberede idemmiri butere n'obodo dị ichiiche na Naịjirịa, ọkachasị ndị no nso na ọwammiri.

Buhari gwara ndị ọrụ gbata gbata na ndị mpaghara gọọmentị ndị ọzọ ka ha 'jiri ikike ha na akụnụba ha nyere ndị ọdachị a metụtara aka."

Ikike a onyeisisala Naịjirịa nyere sitere n'aka onyeisi ngalaba ọrụ gbata gbata a kpọrọ National Emergency Management Agency (NEMA), bụ Mustapha Maihaja.

Onyeisiala, dika ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Graba Shehu siri kwuo n'ozi o zitere ndị ntaakụkọ, gakwara n'ihu sị ka e wetere ya ozi maka ngalaba ọbụla ekweghi mee etu o si kwuo.

Dika akwukwọ ozị a siri kwuo, ka ọ kasiri ndị akụnụba ha na ndi ihe ha lara n'iyi obi ma si ha ndọ, Onyeisiala Buhari kwuru na agbanyeghị na e nweghị ike ịkwụ ụgwọ ndụ, ọchịchị ya ga-eme ihe niile ha ga-emenwu ịhu na ahụhụ ọdachị a butere dịtụ mfe.

Nkasiobi Onyeisiala Buhari na nkwa a o kwere na-abịa ka akukọ na-apụta na ide mmiri richiri ma chụpụ ndị mmadụ n'ụlọ akwụkwọ mahadụm nke a kpọrọ Federal Polytecnic na Bekee nke dị n'Ogbaru.

Map na-egosi ebe idemmiri metụtara
Nkọwa foto, Ide mmiri na-emekwa n'Ebonyi nakwa ụfọdụ steeti ndị ọzọ na Naịjirịa

Ndị obodo ahụ jizi ya bu ụlọakwụkwọ mere ụzọ ụgbọ mmiri.

Ụmụ akwụkwọ n'onwe ha enwetala ezumike izu ụka, iji gbochie ọdachi.

N'aka nke ọzọ, Lokoja, bụ isi obodo Kogi steetị, bukwa ebe ọzọ idemmiri a ji n'ọrụ ka ọtụtụ ụlọ nọ n'okpuru mmiri ụgbụa.

Cheta na NEMA tiri mkpu na mbụ maka ide mmiri ma kwuo ka ndị bi nso na ọwammiri kwapụ tupu ide mmiri nke afọ a ebido.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ