Abia na Enugwu steeti akọwala ka ha si dị njikere maka ide mmiri

Mbuze mmiri ozuzo butere

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oke mmiri ozuzo na-ebutekwa mbuze

Enugwu na Abia bụ steetị ndi dị na mpaghara ọdịda Naịjirịa ekwụrụ na ide mmiri nwere ike imetụta, ekwuola ụzọ dị icheiche ha ji diri dị njikere igbochiri ọdachi.

Cheta na Ngalaba na-ahụ ihe gbasara ihuigwe akpọrọ Nigeria Hydrological Agency na Bekee dọrọ aka na ntị ụnyaahụ na ide mmiri si n'oke mmiri ozuzo ga-emetụta steeti iri atọ n'ise na Naịjiria.

Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu n'Enugwu steeti bụ Fidel Ayogu gwara BBC Igbo na-ekwe ntị etu steeti ahụ si akwado.

Ndi otu Red Cross na-azọpụta ọtụtụ mmadụ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọdọ mmiri tiwara na mba Kenya maka oke mmiri ozuzo mefuru ndụ mmadụ ruru 40

Ọ sị: "anyị agwaala ndị mmadụ ha kpochapụ ahịhia ebe mmiri si aga maka ị gbochi ide ga-eto ma oke mmiri zoo."

N'Abịa ha na-eme ihe yi kwara nke a ebe Kọmishona ji ọrụ mgbasa ozi ebe ahụ bụ John Okeiyi kwuru na ha na-ekpocha ụzọ niile mmiri ga esi ga n'Aba karịcha.

Gee ihe ha abụọ gwara BBC n'uju ebe a:

Aha onyonyo, Ihe John Okiyi kwuru gbasara okwu a
Aha onyonyo, Ihe Fidel Ayogu kwuru gbasara oke mmiri ozizo

Ha niile na ele anya na ihe a ha mere ga-eme ka ide mmiri gharị imebi ihe nke ukwu.

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ