Ebee ka ụmụnwaanyị kwesịrị ịnọ zọọ ọchịchị, be nna ya ka ọ bụ be di ya?

Maka ụmụnwaanyị na ikike dịrị ha
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị na-achọ ka enye ha nkwado zuru oke ma ha pụta ị zọ ọchịchị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụbọchị ole na ole gara aga ka BBC Igbo jụrụ ajụjụ gbasara ebe nwaanyị kwesịrị ịnọ zọọ ọchịchị n'ọbaozi Facebook.

Ihe BBC Igbo chọpụtara agbaghị gharị.

Ebe ọtụtụ na-ekwu na nwaanyị kwesịrị ịnọ na be di ya zọọ ọchịchị, ndị ọzọ sị na nwaanyị nwere ebe obibi abụọ.

Nke pụtara na o nwere ike ịnọ ebe ọbụla dị ya mma zọọ ọchịchị.

Lee ebe ndị mmadụ kwuru uche ha gbasara ya bụ okwu.

Onweghị onye kwetara na nwaanyị kwesịrị ịnọ be nna ya zọọ ọkwa ọchịchị.

Aha onyonyo, Iwu Naịjirịa kwadoro nwaanyị ọbụla ịzọ ọkwa ọchịchị n'obodo ọbụla; maọbụ na be di ya, maọbụ be nna ya.

Ndị ọkaiwu BBC jụrụ ajụjụ a sị na iwu Naịjirịa kwadoro nwaanyị ọbụla ịzọ ọkwa ọchịchị n'obodo ọbụla; maọbụ na be di ya, maọbụ be nna ya.

Ọkaiwu Chika Emmanuel sị na "ndị na-akpachapụ ụmụnwaanyị n'ụzọ a bụ ndọrọndọrọ ka ha ji ya egwu".

N'olu ya, "ọbụghị naanị n'ịzọ ọkwa ọchịchị ka nke a na-eme, ọ na-emekwa ma n'inye ọrụ.

"Ndị be nwoke ụfọdụ ji ya eme ka oke zuo ha.

"Mana iwu megidere ụdịrị agwa a."

Akụkọ ga-amasị gị