Zainab Ahmed: Anyị ga-agba mbọ ịkpatara Naijiria ego

Ebe foto si, Zainab Ahmed/ Twitter
Zainab Ahmed nọchiri Kemi Adeosun dịka Mịnịsta na-ahụ ego na akụnaụba Naịjirịa ebidola ọrụ na Monde ( 17/9/18).
Ahmed bụbu mịnịsịta nta na-ahụ maka bọjetị nọchịrị Adeosun onye gbara arụkwaghịm maka ebubo gbasara asambodo adịgboroja na nsonso a.
Onye odeakwụkwọ mịnịstri ahụ bụ Mahmoud Isa-Dutseha na ndị isi ndị ọzọ iji ọṅụ nabatara ya n'ịsị ụlọrụ ha n'Abụja.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọ gwara ha ka ha gbaa mbọ ịkwalite etu Naijiria si akpata ego iji mezuo ntukwasaobi onyeisiala nwere n'ime ha ha.
"Anyị nwere nnukwu nsogbu na ịkpata ego".
"Ọ bụ ọrụ dịrị anyị ịgba mbọ hụ na ego Naijiria na-akpata gbalitere".
"Onyeisiala nwere ntụkwasị obi na anyị jikọọ ọnụ, anyị ga-emeli ya".
Akụkọ ndị ga-amasị gị:






























