#IWD: NAWOJ ekwuola ka e buso omenaala na-akpagbu ụmụnwaanyị agha

Ebe foto si, Chidota Edozie
Dịka a na-eme ncheta ụbọchị ụmụnwaanyị n'ụwa niile taa, otu jịkọrọ ụmụnwaanyị ndị ntaakụkọ nke a kpọrọ NAWOJ n'aha ịchafụ akpọọla oku ka e tinye uchu na mbọ a na-agba iji kwusi omenaala na-emegide ụmụnwaanyị.
N'akwụkwọ ozi nke osote onyeisi NAWOJ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Chibota Edozie tinyere aka, o kwuru na e nwela ọganihu na mbọ a na-agba ikwụsị omenaala na-emegide ụmụnwaanyị mana ọ dị mkpa ga-etinye uchu ime ka ọ kwụsị mkamkpam.
Ọ sịrị: "Kemgbe, ala anyị dịka omenaala Igbo siri di, anaghị enye ụmụnwaanyị oke dịrị ha na ohere iji zipụta osinachi ha nwere.
"Mana ọ bụ ihe na-akwalite ume na site na mbọ ọtụtụ otu dịka NAWOJ na-agba, ihe gbasara omenaala na-emegbu ụmụnwaanyị."
Ọ gara n'ihu kwuo, "Dịka anyị na-eme ncheta ụbọchị ụmụnwaanyị taa, ana m akpọ ụmụnwaanyị ndị ntaakụkọ nọ n' ọwụwa-anyanwụ oku ka ha kwusie ike n'ịgba mbọ ka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụnwoke hata nha."
Edozie kwere nkwa na otu ha-agaghị ezu ike rue mgbe iji omenaala emegbu ụmụnwanyị ga-abịa na njedebe.




