Enugwu: Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe maka ụkọchụkwụ a nwụchiri

Ebe foto si, AFP
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu agọọla na nwụchị ndị uweojii nwụchiri Reverend Kenneth Okafor nke Emmanuel Methodist Church, Ogbozinne Akpugo na steeti ahụ abụghị iji gbochie ya ịgba akaebe.
Kama ọ bụ ndị uweojii pụrụ iche na-ahụ maka iji egebe ezu ohi nke a kpọrọ FSARS ngalaba nke Legos kpụrụ ụkọchukwu ahụ n'okwu gbasara ogbugbu Igwe obodo ahụ bụ Steven Nwatu.
Ụmụnwaanyị obodo Ogbozinne Akpugo dị n'okpuru ọchịchị Nkanu West n'Enugwu steeti mere ngagharịiwe igosi iwe ha na nwụchi ndị uweojii nwuchiri ụkọchukwu obodo ha n'ime ụlọụka ụbọchị Fraịde.
Ụmụnwaanyị ndị a mere ngagharịiwe boro ndị uweojii ebubo ịnwụchi ụkọchụkwụ ahụ iji mee ka ọ ghara ịza oku kọmiti gọọmentị steeti hibere maka ilebanye anya na ogbugbu Igwe kpọrọ ya.

Na nkọwa ya, Amaraizu kwuru na "A nwụchiri ya maka aka ya ịdị n'ogbugbu Igwe Stephen Nwatu nke Ogbozinne Akpugo.
"Ọ bụ ndị SARS si Adeniji Adele na Legos ji okwu ahụ. Ọ na-enyere ha aka na nyocha ha na-eme."
Okafor kwesiri ịpụta ịgba akaebe n'ihu kọmịtị gọọmenti Enugwu steeti hibere ilebanye anya na nsogbu ogbugbu e gburu igwe mana o nweghị ịke ịza oku ahụ.
Cheta na, ọnwa ole na ole gara aga, ndị obodo ahụ tigbuchara Igwe maka iji ụgbọala ya kụtuo otu onye.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:








