Akpugo dịzị oyi ugbua - Ebere Amarizu
Ebere Amarizu kwuru na kemgbe ihe mberede a mechara ndị uweojii anwụchiela mmadụ ole e kwuru gburu ya bu igwe.
O kwetekwara na ndị a na-enyere ha aka na nyocha ha na-eme gbasara ya bụ mkpamkpa.
Amarizu kwuru na ha ezigala ndị ọrụ ha ka ha chekwa obodo ahụ maka igbochi ọdachi ọzọ.
N'ọnụ ya, ''Udo a dila na Ọgbozinne,ndị ọrụ anyị ka nọkwa ebe ahụ na-echekwa ndị mmadụ.
Gere ihe o kwuru n'uju ebe a:
Na mbụ, Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Danmallam Mohammed kwuru na a ka na-achọ ndị ọzọ e kwuru gburu Igwe ndị Ọgbọzinne.
Ndị ụweojii sị na ha jidere ndị a ekwuru gburu igwe site na nchọpụta ndị ụweojii nakwa otu nchekwa ndị ọzọ mere.
Kọmishọna Mohammed kpọputakwara aha onye ọzọ e kwuru so we gbuo ya bụ eze dika Emmanuel Ede si n'obodo Amede Ehamufu.
O kwuru na ha na-enyere ndị uweojii aka ịchọpụta ihe ndị ọzọ dị njọ ha na ndị otu ya na-eme.
N'ọnụ kọmishọna, ''Mmadụ abụọ a anyị nwuchiri agabuola nga maka mkpamkpa ha na-akpa n'obodo a mana kemgbe ha pụtara ha egbuola ihe ruru mmadụ ato ma meruo otu onye ahụ n'ọhia.''
Tupu anwụchie ndị a e kwuru gburu Igwe Ọgbọzinne, Mohammed kwere ndị igwe ndị ọzọ nkwa maka ịnye ezigbo nchekwa.
Ọ katọrọ ya bụ mkpamkpa ma rịọkwa ka ndị mmadụ ghara iji aka ha maa ndị mmadụ ma nsogbu pụta n'akụkụ ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:













