World Cup 2018: Mekziko egosila Jamini nkarị ma gbaa ha 1 - 0

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Mekziko na ndị Jamini zọrọ onye ga-ebu ụzọ nweta pọintị na tebulu ndị otu F, mana ọ bụ Mekziko meriri ma nweta pọintị atọ.
Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị n'ime elekere ole na-abịa, ka ndị Brazịla na Swizaland ga-agba nke ha.
Egbuchiela bọọlụ.
Nkeji 92: Neuer so pụta ịchọ ma ọ ga-enye goolu.
Ogbu bọọlụ etinyela nkeji atọ
Nkeji 90: Herrera enwetala akwụkwọ edo edo.
Nkeji 88: Brandt a nwaala ike ya n'inye goolu, mana bọolụ pụrụ apụ.
Nkeji 86: Jamini ewepụla Werner, tinye Julian Brandt.
Nkeji 84: Hummels na Thomas Muller enwetala akwụkwọ edo edo, ebe Muller nwetara nke ya maka ịdọ Herrera aka n'uwe, Hummels nwetara nke ya maka ịgba mmadụ ụkwụ.
Nkeji 82: Layun nwetara ezigbote bọọlụ, mana ọ gbafuru ya n'elu poostu.
Nkeji 79: Jamini ewepụla Plattenhardt tinye Mario Gomez.
Nkeji 77: Layun ebutela bọọlụ ka Jamini gbachara 'corner' na nke ha, gbapụ ọsọ, gbaa shọọtụ, mana ọ gbafuru agbafu.
Nkeji 76: Jamini enwetala 'corner' abụọ n'ime otu nkeji, mana o nweghị nke bara na neetị.
Nkeji 75: Kroos agbaala shọọtụ! Mana ọ chọtaghị neetị, bọọlụ pụrụ n'akụkụ neetị.
Nkeji 73: Mekziko ewepụla Guardado tinye Rafael Marquez, nke ga-eme ya Iko Mbaụwa ise Marquez na-aga.
Nkeji 70: Hernandez che na ọ ga-enweta penariti n'ihu poostu ndị Jamini, mana atụpụghịrị ya ọnụ.
Nkeji 67: Jamini bịara nso inye goolu site n'aka Draxler, mana o nweghị isi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nkeji 65: Mekziko ewepụla Lozano nyere goolu, tinye Jimenez.
Nkeji 64: Kimmich nke Jamini agbaala shọọtụ, mana ọ banyeghị na neetị. Ọ gara n'elu ya.
Nkeji 60: Ndị Jamini ewepụla Khedira tinye Marco Reus.
Nkeji 58: Mekziko ewepụla Vela tinye Alvarez.
Nkeji 56: Ndị na-akwado Mekziko na-egosi ha ezigbo nkwado, na-akpalite mmụọ ha.
Nkeji 50: Jamini ebidola ịgba ka ọ bụ bọọlụ a ji ndụ ha.
Nkeji 46: Egwu ebirila ọkụ ọzọ. Isi ndị Jamini ọ ga-apụtakwa?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nkeji 45 na ụma: Agbazuola akara nke mbụ, ebe Mekziko ji otu goolu na-emeri ndị Jamini.
Nkeji 44: Ndị Mekziko na-egosi Jamini na ha abịaghị igwu egwu. Ha na-enye ha ezigbo nsogbu. Mana Jamini ka nọ na-agbafu bọolụ na-ebunye ndị Mekziko bọọlụ kama onye nke ha.
Agbaala shọọtụ itoolu ruru nso poostu kemgbe egwuregwu a ji bido.
Nkeji 40: Moreno enwetala akwụkwọ edo edo maka igbu oge.
Nkeji 37: Jamini anwaala ike ha ịsa goolu e nyere ha, mana o nweghị isi.
Nkeji 35: GOOOOOLLUUUUU! Mekziko agbakaala neetị ndị Jamini. Hernandez bunyere Lozano bọọlụ o ji gbakaa neetị ndị Jamini.
Nkeji 26: Mekziko nwetara bọọlụ mara mma, mana Layun gbafuru ya n'elu poostu.
Nkeji 22: Jamini na-agbasi shọotụ ike ịma ma ha a ga-enweta goolu, mana Ochoa ekwebeghị ha nweta efe. Kroos nwara ike ya, mana isi apụtaghị.
Nkeji 17: Ọ dị ka Jamini enwetewala onwe ha maka na agbawala ka ndị goolu na-agụ agụrụ.
Nkeji 15: Jamini enwetala 'corner', mana Ochoa ghọtara ya.
Nkeji 14: Moreno ji isi taa bọọlụ ka Kroos ji aka butuo bọọlụ mere ka Mekziko nweta 'free kick', mana Neuer ghọrọkwara ya.
Nkeji 12: Ndị Mekziko na-egosi Jamini nkarị n'egwuregwu a, ebe ndị na-akwado ha na-enwe ezigbo aṅụrị.
Nkeji 10: Herrera agbaala shọọtụ, mana Neuer ghọtara ya.
Nkeji asatọ: Mekziko enwetala 'free kick' mana Layun agbafuola ya.
Nkeji atọ: Werner nke Jamini agbafuola bọọlụ o nwetara na-agabu nso poostu.
Otu Nkeji: Mekziko agbapụla bọọlụ ibido egwuregwu ha.
Nke a ga-eme ya ugboro anọ ndị mba Jamini na Mekziko ga-ezukọ n'asọmpi Iko Mbaụwa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị nọ n'ocheJamini: Marc-Andre ter Stegen, Kevin Trapp, Ilkay Gundogan, Mario Gomez, Matthias Ginter, Antonio Rudiger, Leon Goretzka, Julian Brandt, Marco Reus, Niklas Sule, Sebastian Rudy.
Ndị nọ n'oche Mekziko: Jesus Corona, Alfredo Talavera, Marco Fabian, Raul Jimenez, Jonathan dos Santos, Giovani dos Santos, Edson Alvarez, Rafael Marquez, Oribe Peralta, Jesus Manuel Corona, Javier Aquino, Erick Gutierrez.
Ndị Jamini bidoro bọọlụ: Manuel Neuer; Joshua Kimmich, Jerome Boateng, Mats Hummels, Marvin Plattenhardt; Sami Khedira, Toni Kroos; Thomas Muller, Mesut Ozil, Julian Draxler; Timo Werner.
Ndị Mekziko bidoro bọọlụ: Guillermo Ochoa; Carlos Salcedo, Hugo Ayala, Hector Moreno, Jesus Gallardo; Miguel Layun, Andres Guardado, Hector Herrera; Carlos Vela, Javier Hernandez, Hirving Lozano.
Jamini na-agba ịma ma ha e nwere ohere ibuli Iko Mbaụwa ọzọ kemgbe ha bulichara ya n'afọ anọ gara aga.
Ndewo! Daalụ maka isonye anyị n'egwu a.









