Akụkọ kachasị na mgbede a: Ebenebe gburu na Borno steeti
Akụkọ ndị dị mkpa:

Ebe foto si, AFP
Ụmụ nwaanyị isii, ụfọdụ n'ime ha ndị oji ogbunigwe egbu onwe, egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ na otu n'obodo Damboa dị na Borno steeti.
Akụkọ kwuru na nke a mere Na-erughị elekere abụọ onye isiagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai, gwachara ndị gbara ọsọndụ na mpaghara ahụ ka ha laghachị maka na udo adịla.
N'akụkọ yiri nke a,

Ebe foto si, AFP
Mmadụ iri abụọ anwụọla ebe ụmụ nwoke abụọ bu egbe wakporo ndị mmadụ na mmemme ime abali n'obodo Trenton na New Jersey nke dị na mba Amerịka.
Ndị uweoji ekwuola na a gbagburu otu n'ime ụmụnwoke ahụ ma nwụchịkwaa nke ọzọ.
Ọzọ na Naịjirịa,

Ebe foto si, AFP
Ngalaba na-ahụ maka mgbasa ọkụ latrik bụ Transmission company of Nigeria ekwuola na ọkụ latrik ejirila ihe ruru otu puku megawatt n'ọma datuo.
Ha kwuru na ọ bụ okporo mmanụ gas kụwara akụwa na nsogbu ndị ọzọ butere nke a.
N'egwuregwu,

Serbia emeriela Kọsta Rịka ebe Mekziko ji otu ọkpụ merie Jamini ka ha gbachara.
Brazil amalitela egwuregwu ha ma burukwa ụzọ nye goolu ebe ha zutere Swizaland.
Gee nkeji nke mgbede a ebe a
Lee ihe onyonyo nke taa












