World Cup 2018: Enweghị onye meriri ka Brazịl na Swizaland gbara 1-1

Mba Brazịl

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Brazịl bụ mba kachasị bulie Iko Mbaụwa kemgbe e ji malite ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Brazịl na Swizaland gbara onye laba onye laba, n'agbanyeghị na ọtụtụ ndị mmadụ tụrụ anya na Brazịl ga-emeri Swizaland.

Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị echi mgbe anyị ga-ewetara gị ihe ndị ọzọ na-agba.

Brazịl na Swizaland aharala na pọintị, ka ha abụọ nwetara naanị otu pọintị.

Egbuchiela bọọlụ.

Nkeji 90 na ise: Swizaland enwetala 'free kick' nke ha, mana isi apụtaghị.

Nkeji 90 na anọ: Brazil enwetala 'free kick' nke Neymar gbara, mana ọ banyeghị na poostu.

Nkeji 90 na abụọ: Miranda gbapụrụ ezigbo bọọlụ, mana ọ bataghị ọfụma.

Nkeji 90: Brazịl nwetara ezigbote inye goolu ka Firmino tara bọolụ kụrụ Sommer n'ahụ dapụta. Ogbu bọọlụ etinyekwuola nkeji ise.

Nkeji 87: Neymar ataala bọọlụ isi n'ihu neetị ndị Swizaland ka Brazịl nwetara 'free kick', mana Sommer ghọrọla ya.

Aha onyonyo, Lee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ

Nkeji 87: Swaziland ewepụla Lichtsteiner tinye Lang.

Nkeji 86: Ọ fọrọ nkeji anọ na ọma ka e gbuchie bọọlụ. E nwere onye ga-agbawa ibe ya obi?

Nkeji 79: Swizaland ewepụla Seferovic tinye Embolo.

Nkeji 78: Brazịl ewepụla Jesus tinye Firmino.

Nkeji 77: Fernandinho anwaala ike ya ịgba shọotụ, mana isi apụtaghị.

Nkeji 73: Jesus dara n'ala n'ihu poostu ndị Swizaland, mana ogbu bọọlụ egbughị ya penariti.

Nkeji 70: Swizaland ewepụla Behrami tinye Zakaria.

Nkeji 69: Neymar ebunyela Coutinho 'nri chi nyere', Coutinho agbaala ezigbo shọọtụ mana ọ gaghị nso neetị.

Nkeji 67: Enyela Behrami akwụkwọ edo edo maka ịgba Neymar ụkwụ ọjọọ. Nke a ga-eme ya akwụkwọ edo edo ndị Swizaland na-enweta n'abalị a.

Nkeji 66: Brazịl ewepụla Paulinho tinye Renato Augusto.

Nkeji 65: Enyela Schar akwụkwọ edo edo.

Nkeji 60: Brazil ewepụla Casemiro tinye Fernandinho.

Nkeji 59: Coutinho gbara shọotụ abụọ, ọ bataghị, mana Neymar gbara nke pụrụ 'corner'.

Brazil na switzerland

Nkeji 50: GOOOOOLLLUUU! Zuber ejirila isi takaa neetị ndị Brazịl ka Shaqiri bunyere ya bọọlụ. Mba abụọ a aharala nhatanha na goolu ugbua.

Nkeji 47: E nyela Casemiro akwụkwọ edo edo maka igbatu Dzemaili.

Nkeji 46: E bidola ọkara nke abụọ, ebe Brazịla na-achọ ịma ma ha a ga-enyenwu goolu ọzọ.

Nkeji 45 na ụma: Ogbu bọọlụ egbuchiela bọọlụ nke ọkara mbụ, ka a gaa ezumiike nkeji 15.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Nkeji 45 na ụma: Brazil enwetala 'corner' mana onweghị ihe ha ji ya mee.

Nkeji 45: Ogbu bọọlụ etinyekwupla nkeji abụọ.

Nkeji 43: Shaqiri butere bọolụ, gbapụ ya ebe ọ na-achọ neetị, mana Casemiro ji isi tafuo ya.

Nkeji 40: Shọotụ Zuber ebiela Thiago Silva n'ihu.

Nkeji 32: Brazịl enwetala 'corner' mana Neymar bi na poostu (ọ nọ 'offside') ka ọ na-achọ ịgba bọọlụ ọzọ.

Nkeji 30: Ogbu bọọlụ enyela Lichtsteiner akwụkwọ edo edo maka ịgbatu Neymar.

Nkeji 26: Schar na Casemiro abatala. Ha ka ga-eso agba bọọlụ.

Nkeji 25: Schar na Casemiro atakọtala isi ọnụ n'ikuku. Ha na-anata ọgwụgwọ.

Nkeji 24: Swizaland ewetala 'corner' site n'aka Dzemaili, mana o nweghị ihe ha ji ya mee.

Nkeji 23: Swizaland e nwere ike ịsa goolu a? Ndị Brazịla enyechabeghị ha ohere.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ndị na-akwado Brazịl agusiwela egwu ike, obi dị ha ezigbo ụtọ.

Nkeji 20: GOOOLLLLLUUU! Philippe Coutinho enyerela Brazil goolu.

Ndị mba Swizaland

Ebe foto si, Getty Images

Nkeji 15: Neymar gbara 'free kick' ahụ mana ọ dabaghị. O biri n'ahụ ndị Swizaland.

Nkeji 14: Behrami agbatuola Neymar, mere ka ndị Brazil nweta 'free kick'.

Nkeji 11: Brazịl gaara enye goolu ugbua, ka Paulinho gbabatara nso poostu, Neymar bufeere ya bọọlụ, mana ọ banyeghị ọfụma n'ụkwụ Paulinho, mere ka ọ gbafuo ya.

Nkeji 10: Ụkwụ Neymar emetụbeghị bọọlụ ọfụma etu ndị mmadụ chọrọ maọbụ na-eche.

Ị ma na e nwere nwaafọ Naịjirịa na-agbara ndị Swizaland? Aha ya bụ Manuel Akanji.

Nkeji atọ: Shaqiri butere bọọlụ, gaa nso neetị, bunye Dzemaili, mana ọ gbafuru ya.

Bọọlụ ebirila ọkụ ka mba abụọ a gụchara abụ ala ha.

Ndị nọ n'ocheSwizaland: Josip Domic, Breel Embolo, Johan Djourou, Francois Moubandje, Denis Zakaria, Gelson Fernandes, Michael Lang, Yvon Mvogo, Remo Freuler, Mario Gavranovic, Nico Elvedi, Roman Burki.

Ndị nọ n'oche Brazịl: Ederson, Douglas Costa, Geromel, Taison, Roberto Firmino, Cassio, Marquinhos, Renato Augusto, Fagner, Filipe Luis, Fernandinho.

Ndị Swizaland bidoro bọọlụ: Yann Sommer, Stephan Lichtsteiner (kaptịn), Fabian Schar, Manuel Akanji, Ricardo Rodriguez, Valon Behrami, Granit Xhaka, Xherdan Shaqiri, Blerim Dzemaili, Steven Zuber, Haris Seferovic.

Ndị Brazil bidoro bọọlụ: Alisson, Danilo, Thiago Silva, Miranda, Marcelo (kaptịn), Paulinho, Casemiro, Coutinho, Willian, Gabriel Jesus, Neymar.

Ndị FIFA kpọrọ aha Swizaland n'ọkwa isii nke ọkachasị agba bọọlụ nke afọ a, tupu Iko Mbaụwa a ebido.

Anya niile dị n'ahụ Brazịl ịma ma ha a ga-eme ọfụma karịa ndị Jamini e meriri taa. Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na Brazịl ga-emeri ma bulie Iko Mbaụwa nke afọ a. Ha a ga-emenwu ya?

Ndewo! Daalụ maka isonye anyị n'egwu a.