Transfer Deadline: Lee ndị a zụrụ na ego ole a zụrụ ha na EPL

Transfer deadline.

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'elekere isii (elekere ise na England) nke mgbede taa bụ Tọọzde abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst ka 'ọba ahịa' ndị otu egwuregwu bọọlụ nke England ga-apịachi.

Ọba ahịa abụghị ahịa a na-ahụ anya kama ọ bụ oge e wepụtara ka ndị otu egwuregwu bọọlụ dị iche iche zụrụ ndị ga-agbara ha bọọlụ maọbụ ree ndị ha achọghịzi.

BBC Igbo na-ewetara gị otu ihe si gbata kwụrụ ugbua n' egwuregwu, "English Premier League".

Alex Iwobi

Alex Iwobi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iwobi ga-ahapụ Arsenal gawa Everton.

Nwaafọ Igbo a ga-ahapụ Arsenal gawa Everton dịka otu abụọ a kwekọritara ego dị nde paund iri anọ (£40 million).

Everton bu ụzọ kweta ịkwụ nde paund iri atọ (£30 million) maka Iwobi, mana Arsenal jụrụ ajụ.

Mana ha mechara kwelite ọnụ were zụrụ ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'aka nke ọzọ, ndị Arsenal zụtara otu nwata nwokorobịa aha ya bụ Kieran Tierney.

Tierney onye mba Scotland gbabuuru ndị Celtic. Ọ gbara afọ iri abụọ na abụọ.

Romelu Lukaku

Romelu Lukaku

Ebe foto si, Getty Images

Nwaokorobịa a na-agbaburu otu egwu Manchester United ahapụla England gawa mba Italy ebe ọ ga-esonyere ndị otu egwu Inter Milan.

Man Utd na Inter ekwekọrịtala ego dị nde paund iri asaa na anọ mana a na-ele anya na ego ahụ ga eru nde paund iri asatọ n'ọdịnihu.

Lukaku erutelarị na Italy ebe a ga-enyocha ya ahụ tupu o binye aka n'akwụkwọ.

Ọṅụ juputara ndị nkwado Inter Milan obi n'ihi ọbịbịa Lukaku.

David Luiz na Laurient Koscielny

David Luiz

Ebe foto si, Getty Images

Luiz ahapụla Chelsea, mana ọ gateghị aka n'ihi na Arsenal ebe ọ gara ka dịkwa na London bụ ebe Chelsea dị.

Arsenal zụrụ Luiz iji nọchie anya Laurient Koscielny bụ onye gbara abụbụ hapụ ha gawa obodo ya bụ France wee sonyere ndị Bordeaux.

Bordeaux kwụrụ Arsenal nde Euro ise iji zụrụ Koscielny, ebe Arsenal kwụrụ Chelsea nde paund asatọ maka Luiz.

Paulo Dybala na Mario Mandzukic

Paulo Dybala na Mario Mandzukic

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ kọburu na ndị Manchester United nwere ike ịzụta Paulo Dybala maọbụ Mario Mandzukic iji nọchie anya Lukaku.

Dybala na Mandzukic na-agbara otu egwu Juventus, mana ọdịghị ka okwu ha na Man Utd a ga-enwe isi.

Ndị otu Tottenham tinyekwara anya maka Dybala mana nke ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla.

Wilfried Zaha

Wilfried Zaha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Wilfried Zaha

Nwaokorobia Ivory Coast a etinyela akwụkwọ na-agwa ndị Crystal Palace na ya chọrọ isi n'otu ha pụọ.

Agwa a Zaha kpara gbawara ndị Palace obi n'ihi na ọ bụ otu onye ha ji eme ọnụ.

Arsenal na Everton egosila mmasị ịzụrụ Zaha mana amabeghi ka ọ ga-esi dị.

Crystal Palace kwuru na ha agaghị ere Zaha ma ọ bụrụ na ha azụtaghị onye ga-anọchị ya.

Marcos Rojo

Marcos Rojo

Rojo esozighị n'ihe a na-eme na Manchester United, mana Everton chọrọ ya.

Mkparịtaụka ka na-aga n'ihu n'etiti otu egwuregwu abụọ a maka Rojo, mana oge adịghịzii.

Akụkọ na-abịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Coach Supremo: Onye chọpụtara JJ Okocha na ndị ọzọ